Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Hibru 8:1 - Bible Nso

1 Ma isi ihe n'ihe nile ayi nēkwu bu nka: Ayi nwere onye-isi-nchu-àjà di otú a, Onye nọduru ala n'aka-nri nke oche-eze nke Idi-uku ahu di nime elu-igwe,

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

1 Isi okwu dị nʼihe niile anyị na-ekwu bụ nke a, na anyị nwere onyeisi nchụaja dị otu a, bụ onye na-anọdụ ala nʼaka nri nke ocheeze onye ahụ kachasị ihe niile elu nʼeluigwe.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Hibru 8:1
21 Iomraidhean Croise  

Jehova, Gi nwe idi-uku, na idi-ike, na ima-nma, na nmeri, na ebube: n'ihi na ihe nile di n'elu-igwe na n'uwa bu nke Gi; Jehova, Gi nwe ala-eze, Gi bu kwa Onye anēweli elu iburu ihe nile onye-isi.


N'Ugwu ka ọla-edo, bú ọmùmù-ìhè, nēsi bia: Chineke ka ebube di egwu nādikwasi.


Gọzie Jehova, nkpuru-obim. Jehova, Chinekem I di uku nke-uku; Ebube na ima-nma ka I yiriworo dika uwe.


Ihe nke si n'ọnu Jehova puta nāsi onye-nwem, Nọdu ala n'aka-nrim, Rue mb͕e M'gēdo ndi-iro-gi ka ihe-nb͕akwasi diri ukwu-gi abua.


Ime ka umu madu mara idi-ike-Ya nile, Na nsọpuru nke ima-nma nke ala-eze-Ya.


Nsọpuru-ya di uku na nzọputa-Gi: Ebube na ima-nma ka I nātukwasi ya.


Ndi ahu gēbuli olu-ha, ha gēti nkpu ọṅù; n'ihi nbili-elu Jehova ha gēsi n'oké osimiri tisie nkpu ike.


Ọ gēguzo kwa, zùa ìgwè aturu-ya n'ike nke Jehova, na nbili-elu nke aha Jehova, bú Chineke-ya: ha gēbiri kwa; n'ihi na ub͕u a ka ọ gādi uku rue nsọtu nile nke uwa.


Ya mere, otú a, mb͕e Ọ gwasiri ha okwu, ewe kuru Onye-nwe-ayi Jisus rigo n'elu-igwe, O we nọdu n'aka-nri nke Chineke.


nke m'bu ukọ̀ nime nkpọrọ n'ihi ya; ka m'we kwuwa okwu nime ya, dika m'nāghaghi ikwu.


Ya mere, ọ buru na unu soro Kraist-ayi bilikọ, nāchọnu ihe di n'elu, ebe Kraist-ayi nọ, nānọdu n'aka-nri Chineke.


Ma ọ̀ bu onye n'etiti ndi-mọ-ozi ka O kwuworo okwu bayere ya mb͕e ọ bula, si, Nọdu ala n'aka-nrim, Rue mb͕e M'gēdo ndi-iro-Gi ka ihe-nb͕akwasi ukwu-Gi abua?


Onye, ebe Ọ bu nnwupu nke ebube-Ya na onyinyo nke udi-Ya, ebe O nēbu kwa ihe nile site n'okwu nke ike-Ya, mb͕e Ọ sachasiri nmehie nile ayi, O we nọdu n'aka-nri nke Idi-uku ahu di n'elu;


ma Onye ahu, mb͕e O chereri otù àjà n'iru Chineke n'ihi nmehie, O we nọdu n'aka-nri Chineke mb͕e nile;


nēlegide Jisus anya, bú onye-ndú na onye-nmezu nke okwukwe-ayi, Onye n'ihi ọṅù edebere n'iru Ya nātachi obi n'obe-Ya, nēlelì ihere anya, O we nọdu n'aka-nri nke oche-eze Chineke.


O sitere na ya ji ugwọ ka eme ka O yie umu-nna-Ya n'ihe nile, ka O we ghọ onye-isi-nchu-àjà di ebere, Onye kwesi-kwa-ra ntukwasi-obi, n'ihe nile diri Chineke, ka O we me ka obi Chineke juru n'ebe nmehie nile nke ndi nke Ya di.


Ya mere, umu-nnam di nsọ, ndi nketa nke ọkpukpọ nke elu-igwe, tugharinu uche n'Onye-ozi na Onye-isi-nchu-àjà nke nkwuputa-ayi, bú Jisus;


Ya mere ebe ayi nwere Onye-isi-nchu-àjà di uku, Onye gabigaworo eluigwe nile, bú Jisus Ọkpara Chineke, ka ayi jidesie nkwuputa-ayi ike.


Onye nēmeri emeri, ya ka M'gēkweye ka o som nọdu ala n'oche-ezem, dika Mu onwem meri-kwa-ra, we so Nnam nọdu ala n'oche-eze-Ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan