Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Hibru 7:28 - Bible Nso

28 N'ihi na iwu nēdo madu ndi-isi-nchu-àjà, ndi nādighi ike; ma okwu nke iṅu-iyi ahu, nke soro iwu ahu n'azu, nēdo Ọkpara, Onye emeworo Ya ka O zue okè rue mb͕e ebighi-ebi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

28 Nʼihi na iwu na-ahọpụta dị ka ndịisi nchụaja ndị mmadụ na-adịghị ike. Ma okwu nke ịṅụ iyi ahụ, nke na-eso iwu nʼazụ, họpụtara Ọkpara, onye e mere ka o zuo oke ruo mgbe ebighị ebi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Hibru 7:28
17 Iomraidhean Croise  

Jehova aṅuwo iyi, Ọ gaghi-echèghari kwa uche-Ya, Gi onwe-gi bu onye-nchu-àjà rue mb͕e ebighi-ebi Dika usoro Melkizedek si di.


ọ buru na onye-nchu-àjà etere manu emehie dika ikpe-ọmuma ndim si di; ọ gēweta kwa nso nwa-oke-ehi zuru okè bayere nmehie-ya, nke o mehieworo, ichuru Jehova, ka ọ buru àjà-nmehie.


O we si ha, Ganu, si nkita-ọhia ahu, Le, anamachupu ndi-mọ ọjọ, nāluzu kwa ọlu ime ka aru di madu ike ta na echi, n'ubọchi nke-atọ emekwam ka M'zu okè.


Ya mere mb͕e Jisus narasiri manya-vine ahu nke b͕ara uka, Ọ siri, Ọ gwuwo O we rube isi, rara mọ-Ya nye.


Ọ gwara ayi okwu n'ọgwugwu ubọchi ndia nime Ọkpara, Onye O doro onye-nketa nke ihe nile, Onye O site-kwa-ra n'aka-Ya me uwa nile;


N'ihi na o kwesiri Ya, bú Onye ihe nile di n'ihi Ya, Onye ihe nile site-kwa-ra n'aka-Ya di, ebe O kubatarari ọtutu umu-ndikom n'ebube, ka O site n'ahuhu me ka Onye nēdubà ha na nzọputa-ha zue okè.


O sitere na ya ji ugwọ ka eme ka O yie umu-nna-Ya n'ihe nile, ka O we ghọ onye-isi-nchu-àjà di ebere, Onye kwesi-kwa-ra ntukwasi-obi, n'ihe nile diri Chineke, ka O we me ka obi Chineke juru n'ebe nmehie nile nke ndi nke Ya di.


Ya mere, umu-nnam di nsọ, ndi nketa nke ọkpukpọ nke elu-igwe, tugharinu uche n'Onye-ozi na Onye-isi-nchu-àjà nke nkwuputa-ayi, bú Jisus;


ma Kraist kwesiri ntukwasi-obi dika Ọkpara, Nke bu onye-isi n'èzi-na-ulo-Ya; Onye ayi onwe-ayi bu èzi-na-ulo-Ya, ma ọ buru na ayi jidesie nkwuwa-okwu-ayi na inya-isi nke olile-anya-ayi ike rue ọgwugwu ihe nile.


Ya mere ebe ayi nwere Onye-isi-nchu-àjà di uku, Onye gabigaworo eluigwe nile, bú Jisus Ọkpara Chineke, ka ayi jidesie nkwuputa-ayi ike.


Otú a Kraist enyeghi kwa Onwe-ya otuto ka ewe me Ya onye-isi-nchu-àjà, kama ọ bu Onye siri Ya, Ọkparam ka Gi onwe-gi bu, Mu onwem amuwo Gi ta:


(n'ihi na ọ bu ezie na emewo ha ka ha buru ndi-nchu-àjà nāṅughi iyi; ma emewo Ya onye-ya n'iṅu iyi site n'aka Onye ahu Nke nēkwu okwu bayere Ya, si, Onye-nwe-ayi ṅuru iyi, Ọ gaghi-echèghari kwa uche-Ya, Gi onwe-gi bu onye-nchu-àjà rue mb͕e ebighi-ebi);


ma Ya onwe-ya, n'ihi na Ọ nānọgide rue mb͕e ebighi-ebi, O nwere ọnọdu-onye-nchu-àjà-Ya nādighi-agabiga onye ọzọ.


enweghi nna, enweghi nne, enweghi akukọ osuso-ọmumu, enweghi nmalite ubọchi ma-ọbu ọgwugwu ndu, ma emewo ya ka o yie Ọkpara Chineke), ọ nānọgide onye-nchu-àjà mb͕e nile.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan