Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Hibru 7:13 - Bible Nso

13 N'ihi na Onye ahu anēkwu ihe ndia bayere Ya eketawo òkè n'ebo di iche, nke ọ dighi onye ọ bula nyeworo aka n'ebe-ichu-àjà site na ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

13 Nʼihi na onye ahụ e kwuru ihe ndị a banyere ya sitere nʼagbụrụ ọzọ, nke ọ dịbeghị onye ọbụla sitere na ya rụrụ ọrụ dị nʼebe ịchụ aja.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Hibru 7:13
6 Iomraidhean Croise  

iburu umu Israel ihe-ncheta, ka nwoke ala ọzọ onye nēsiteghi na nkpuru Eron, we ghara ibia nso isure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'iru Jehova; ka ọ ghara idi ka Kora, di kwa ka nzukọ-ya: dika Jehova gwara ya okwu n'aka Moses.


O gēru kwa, na nwoke ahu nke M'gārọputa, nkpa-n'aka-ya gāma ifuru: M'gēme kwa ka ntamu nile nke umu Israel si n'arum bìe, bú nke ha onwe-ha nātamu megide unu.


Ya mere ọ buru na ewere ọnọdu ndi-nchu-àjà ndi Livai me ka madu zue okè (n'ihi na ndi Israel anatawo iwu n'okpuru ya), nkpà gini ọzọ di ka onye-nchu-àjà di iche bilie dika usoro Melkizedek si di, ka aghara kwa igu ya dika usoro Eron si di?


N'ihi na ebe enyeworo ọnọdu ndi-nchu-àjà ahu, ọ di nkpà ka ọdida nke iwu puta kwa.


N'ihi na ọ putawo ìhè na Onye-nwe-ayi esiwo na Juda rọputa; bú ebo nke Moses nēkwughi ihe ọ bula bayere ndi-nchu-àjà nye ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan