Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Hibru 7:11 - Bible Nso

11 Ya mere ọ buru na ewere ọnọdu ndi-nchu-àjà ndi Livai me ka madu zue okè (n'ihi na ndi Israel anatawo iwu n'okpuru ya), nkpà gini ọzọ di ka onye-nchu-àjà di iche bilie dika usoro Melkizedek si di, ka aghara kwa igu ya dika usoro Eron si di?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

11 Ọ bụrụ na a pụrụ ime ka mmadụ zuo oke site nʼọnọdụ ndị nchụaja ndị Livayị, nʼihi na ọ bụ site nʼiwu e nyere ndị mmadụ ka e ji hiwee ọnọdụ ndị nchụaja. Olee uru ọ bara ka onye nchụaja ọzọ bịa, dị ka usoro Melkizedek si dị, na-abụghị dị ka usoro nke Erọn?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Hibru 7:11
17 Iomraidhean Croise  

Ajughm amara nke Chineke: n'ihi na asi na ezi omume abia site n'aka iwu, ya mere Kraist nwuru n'efu.


Otú a ayi onwe-ayi kwa, mb͕e ayi bu umu ọhu, ọ bu n'okpuru ihe-ozizí mbu nke uwa ka ejidere ayi dika orù


ma ub͕u a, mb͕e unu maworo Chineke, ma-ọbu, nke bu ezi-okwu kari, unu bu ndi Chineke maworo, ùnu si aṅa chighari ọzọ n'ihe-ozizí mbu nādighi ike nēnweghi kwa ihe ọ bula, nke unu nācho ibu orù-ha ọzọ ọhu?


Onye Chineke nyere aha onye-isi-nchu-àjà dika usoro Melkizedek si di.


dika O si kwu kwa n'ebe di iche, si, Gi onwe-gi bu onye-nchu-àjà rue mb͕e ebighi-ebi Dika usoro Melkizedek si di.


n'ebe Jisus batara n'ihi ayi dika onye nēbu uzọ b͕a ọsọ, ebe emere Ya ka Ọ buru onye-isi-nchu-àjà rue mb͕e ebighi-ebi dika usoro nke Melkizedek si di.


n'ihi na ọ nānọ n'aha nna-ya n'oge ahu, mb͕e Melkizedek zutere ya.


N'ihi na ebe enyeworo ọnọdu ndi-nchu-àjà ahu, ọ di nkpà ka ọdida nke iwu puta kwa.


N'ihi na Onye ahu anēkwu ihe ndia bayere Ya eketawo òkè n'ebo di iche, nke ọ dighi onye ọ bula nyeworo aka n'ebe-ichu-àjà site na ya.


Ihe ayi nēkwu aputabigawo kwa ìhè ókè nke-uku kari, ma ọ buru na Onye-nchu-àjà di iche ebilie dika oyiyi Melkizedek si di,


(n'ihi na ọ bu ezie na emewo ha ka ha buru ndi-nchu-àjà nāṅughi iyi; ma emewo Ya onye-ya n'iṅu iyi site n'aka Onye ahu Nke nēkwu okwu bayere Ya, si, Onye-nwe-ayi ṅuru iyi, Ọ gaghi-echèghari kwa uche-Ya, Gi onwe-gi bu onye-nchu-àjà rue mb͕e ebighi-ebi);


N'ihi na asi na ọb͕ub͕a-ndu mbu ahu adighi ita uta, agaghi-achọwori ebe nye ọb͕ub͕a-ndu nke-abua.


Ma ebe edoziworo ihe ndia otú a, ndi-nchu-àjà nābà n'ulo-ikwū mbu mb͕e nile, nēkpezu ekpere nile ha;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan