Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Hibru 6:7 - Bible Nso

7 N'ihi na ala nke ṅuworo miri-ozuzo nke nēzokwasi ya ọtutu mb͕e, nke nēpuputa kwa nkpa-akwukwọ kwesiri ndi ahu, bú ndi anālu kwa ya ọlu n'ihi ha, ala ahu nēkère ngọzi si n'aka Chineke bia:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

7 Nʼihi na ala ahụ nke na-amị mmiri na-ezokwasị nʼelu ya mgbe niile, na-amịpụta mkpụrụ bara ụba nye ndị e ji maka ha kọọ ya, na-enweta ngọzị nʼaka Chineke.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Hibru 6:7
17 Iomraidhean Croise  

Chineke we si, Ka ala puputa ahihia ndu, ihe-ọkukú nke nāmiputa nkpuru-ọghigha, osisi mkpuru nke nāmi mkpuru di iche iche, nke mkpuru-ọghi-gha-ya di nime ya, n'elu ala: o we di otú a.


Ọ bia nso, sutu ya ọnu: o we nu ísi uwe-ya, gọzie ya, si, Le, ísì nwam Di ka ísi ọhia nke Jehova gọzi-woro:


Onye nēbu nju-aka nkpuru-ọghigha, ọ bu ezie na ọ nēje ije nākwa ákwá; Ma ọ ghaghi iwere iti-nkpu-ọṅù biaghachi, nēbu ùkwù-ọka-ya nile.


Ọ gānata ngọzi n'aka Jehova, Na ezi omume naka Chineke nke nzọputa-ya.


N'ihi na M'gāwukwasi miri n'aru onye akpiri nākpọ nku, na ọtutu miri-iyi n'ala-akọrọ: M'gāwukwasi Mọm n'aru nkpuru-gi, na ngọzim n'aru umu i muru:


M'gēme kwa ka ha na ebe nile nke di ugwu ntàm buruburu ghọ ngọzi; M'gēme kwa ka oké miri-ozuzo zo na mb͕e-ya; oké miri-ozuzo nke ngọzi gādi.


Gharanu onwe-unu nkpuru n'ezi omume, wenu ihe-ubi dika ebere si di; lucharanu onwe-unu ubi: n'ihi na ọ bu mb͕e ichọ Jehova, rue mb͕e Ọ gābia, zokwasi unu ezi omume dika miri.


M'gēnye kwa ngọzim iwu idakwasi unu n'arọ nke-isi, ọ gēme-kwa-ra arọ atọ ahu ihe-ọmume.


Webatanu otù uzọ n'uzọ iri nile n'ulo-àkù nkem, ka ihe-oriri we di n'ulom, biko, nwanum na nka, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri, ma M'gaghi-emeghere unu window nile nke elu-igwe, wusara unu ngọzi, rue mḅe ọnọdu agaghi-ezu inagide ya.


n'ihi na onye ọ bula nke nāriọ nāriọta; onye nāchọ kwa nāchọta; onye nāku kwa ka agēmeghere.


Onye-ọlu-ubi nke nādọb͕u onwe-ya n'ọlu aghaghi ibu uzọ kère òkè na nkpuru-ya.


Ya mere, umu-nnam, nātachinu ogologo-ntachi-obi rue ọbibia nke Onye-nwe-ayi. Le, onye-ọlu-ubi nēche nkpuru di oké ọnu-ahia nke ala, nātachi ogologo-ntachi-obi n'ebe ọ di, rue mb͕e ọ gānata miri-ozuzo mbu na miri-ozuzo ikpe-azu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan