3 Nka ka ayi gēme kwa, ma ọ buru na Chineke kwe.
3 Anyị ga-eme nke a ma Chineke kwe.
ma mb͕e o kelesiri ha ekele ikpe-azu, si kwa, M'gālaghachikute unu ọzọ, ma Chineke kwe, o si n'Efesọs nupu ub͕ọ.
ka m'we biakute unu n'ọṅù site n'ọchichọ Chineke, ka mu na unu we zukọ kwa ike.
N'ihi na achọghi m ihu unu ub͕u a n'uzọ ijem; n'ihi na anamele anya na m'gānọgide na nke unu oge ufọdu, ma asi na Onye-nwe-ayi gēkwe.
Ma m'gābiakute unu ọsọsọ, ma ọ buru na Onye-nwe-ayi chọrọ; m'gāmara kwa, ọ bughi okwu nke ndi fuliworo onwe-ha, kama ike-ha.
N'ihi na ndi enyere ìhè otù mb͕e, ndi detu-kwa-ra onyinye elu-igwe ahu ire, ndi eme-kwa-ra ka ha keta Mọ Nsọ,
Ma nke kwesiri unu ka unu kwue bu, Asi na Onye-nwe-ayi chọrọ, ayi gādi ndu, me kwa ihe a ma-ọbu ihe ahu.