Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Hibru 6:20 - Bible Nso

20 n'ebe Jisus batara n'ihi ayi dika onye nēbu uzọ b͕a ọsọ, ebe emere Ya ka Ọ buru onye-isi-nchu-àjà rue mb͕e ebighi-ebi dika usoro nke Melkizedek si di.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

20 ebe Jisọs onye buru anyị ụzọ, abanyela nʼihi anyị; ọ ghọlara anyị onyeisi nchụaja ruo mgbe ebighị ebi dị ka usoro Melkizedek si dị.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Hibru 6:20
20 Iomraidhean Croise  

Jehova aṅuwo iyi, Ọ gaghi-echèghari kwa uche-Ya, Gi onwe-gi bu onye-nchu-àjà rue mb͕e ebighi-ebi Dika usoro Melkizedek si di.


Otú a ka unu gēbuli, ọbuná unu onwe-unu, àjà-nbuli nke Jehova sitere n'otù uzọ n'uzọ iri nke ihe unu nile, nke unu nānara n'aka umu Israel; unu gēsi kwa na ya nye Eron, bú onye-nchu-àjà, àjà-nbuli nke Jehova.


Ònye bu onye ahu nke gāma ikpé? Ọ̀ bu Kraist Jisus Onye nwuru, ma nke kariri, emere Ya ka O si na ndi nwuru anwu bilie, Onye nọ n'aka-nri Chineke, Onye nāriọ-kwa-ra ayi aririọ?


Onye agọziri agọzi ka Ọ bu, bú Chineke na Nna nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, Onye were ngọzi nile ọ bula nke Mọ Nsọ gọzie ayi n'ebe di n'elu-igwe nime Kraist:


Onye, ebe Ọ bu nnwupu nke ebube-Ya na onyinyo nke udi-Ya, ebe O nēbu kwa ihe nile site n'okwu nke ike-Ya, mb͕e Ọ sachasiri nmehie nile ayi, O we nọdu n'aka-nri nke Idi-uku ahu di n'elu;


nēlegide Jisus anya, bú onye-ndú na onye-nmezu nke okwukwe-ayi, Onye n'ihi ọṅù edebere n'iru Ya nātachi obi n'obe-Ya, nēlelì ihere anya, O we nọdu n'aka-nri nke oche-eze Chineke.


N'ihi na o kwesiri Ya, bú Onye ihe nile di n'ihi Ya, Onye ihe nile site-kwa-ra n'aka-Ya di, ebe O kubatarari ọtutu umu-ndikom n'ebube, ka O site n'ahuhu me ka Onye nēdubà ha na nzọputa-ha zue okè.


O sitere na ya ji ugwọ ka eme ka O yie umu-nna-Ya n'ihe nile, ka O we ghọ onye-isi-nchu-àjà di ebere, Onye kwesi-kwa-ra ntukwasi-obi, n'ihe nile diri Chineke, ka O we me ka obi Chineke juru n'ebe nmehie nile nke ndi nke Ya di.


Ya mere, umu-nnam di nsọ, ndi nketa nke ọkpukpọ nke elu-igwe, tugharinu uche n'Onye-ozi na Onye-isi-nchu-àjà nke nkwuputa-ayi, bú Jisus;


Ya mere ebe ayi nwere Onye-isi-nchu-àjà di uku, Onye gabigaworo eluigwe nile, bú Jisus Ọkpara Chineke, ka ayi jidesie nkwuputa-ayi ike.


Onye Chineke nyere aha onye-isi-nchu-àjà dika usoro Melkizedek si di.


dika O si kwu kwa n'ebe di iche, si, Gi onwe-gi bu onye-nchu-àjà rue mb͕e ebighi-ebi Dika usoro Melkizedek si di.


Ma isi ihe n'ihe nile ayi nēkwu bu nka: Ayi nwere onye-isi-nchu-àjà di otú a, Onye nọduru ala n'aka-nri nke oche-eze nke Idi-uku ahu di nime elu-igwe,


O siteghi kwa n'ọbara nke ewu na nke umu-ehi, kama O sitere n'ọbara nke Ya onwe-ya, ba n'ebe nsọ nání otù mb͕e, ebe Ọ chọputara nb͕aputa ebighi-ebi.


N'ihi na Kraist abàghi n'ebe nsọ eji aka me, bú ihe-atù yiri ebe nke bu ebe nsọ n'ezie; kama Ọ bàra n'elu-igwe onwe-ya, igosi Onwe-ya n'iru Chineke n'ihi ayi ub͕u a:


Onye nọ n'aka-nri nke Chineke, ebe Ọ gara ba n'elu-igwe; edowo kwa ndi-mọ-ozi na ndi nāchi isi na ndi di ike n'okpuru Ya.


Umu-ntakirim, anamedegara unu akwukwọ, n'ihi na agbagharawo unu nmehie-unu n'ihi aha-Ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan