15 Otú a o we nwe ogologo-ntachi-obi, we nata kwa nkwa ahu.
15 Ebraham nwere ndidi, natakwa ihe e kwere ya na nkwa.
Abram we je, dika Jehova gwara ya okwu; Lot we so ya je: Abram b͕ara ọgu arọ atọ na iri na ise mb͕e o siri na Heran pua.
Ma umu Israel muru ọmùmù, ri nne, ba uba, we nwe ume nke uku; ala ahu we juputa na ha.
ka unu we ghara ighọ ndi ume-ngwu, kama ka unu we buru ndi nēṅomi ndi ahu ndi ji okwukwe na ogologo-ntachi-obi nēketa nkwa ahu.
Ọ bu kwa n'ihi nka ka Ọ bu onye-ob͕ub͕o nke ọb͕ub͕a-ndu ọhu, ka ọ gābu, ebe otù Onye nwuru ib͕aputa madu n'aka njehie nile nke di n'okpuru ọb͕ub͕a-ndu mbu ahu, ka ndi akpọworo we nata nkwa nke nketa ebighi-ebi ahu.