Ndị Hibru 6:1 - Bible Nso1 N'ihi nka ka ayi rapu okwu nke nmalite nke Kraist, ka anēburu kwa ayi rue n'itozu-okè; ka ayi ghara itọ ntọ-ala ọzọ nke bu nchèghari iji pua n'ọlu nile nwuru anwu, na okwukwe ekwere na Chineke, Faic an caibideilBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a1 Ya bụ ka anyị na-aga nʼihu nʼihe mmụta zuru ezu, ka anyị gharakwa ịnọgide nʼihe mmụta mbụ ahụ nke anyị nwere banyere Kraịst. Anyị agaghị alaghachi azụ ịtọ ntọala nchegharị ọzọ site nʼọrụ ndị nwụrụ anwụ nʼokwukwe nʼebe Chineke nọ, Faic an caibideil |
M'gāwukwasi kwa n'ulo Devid na n'aru onye bi na Jerusalem, mọ nke amara na aririọ-amara nile; ha gēlegidekwam anya, bú Onye ha mapūworo amapú: ha gēti-kwa-ra ya aka n'obi, dika madu si eti-kwa-ra nwa-nwoke amuru nání ya aka n'obi, obi-ha gēlu kwa ilu bayere ya, dika onye obi-ya nēlu ilu bayere nwa o buru uzọ mu.