Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Hibru 5:5 - Bible Nso

5 Otú a Kraist enyeghi kwa Onwe-ya otuto ka ewe me Ya onye-isi-nchu-àjà, kama ọ bu Onye siri Ya, Ọkparam ka Gi onwe-gi bu, Mu onwem amuwo Gi ta:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

5 Nʼotu aka ahụ kwa, Kraịst enyeghị onwe ya ebube nke ịbụ onyeisi nchụaja, kama Chineke sịrị ya, “Ị bụ Ọkpara m. Taa abụrụla m Nna gị.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Hibru 5:5
12 Iomraidhean Croise  

M'gākọ akukọ bayere ukpuru: Jeohva sirim, Ọkparam ka gi onwe-gi bu; Mu onwem amuwo gi ta.


Ma gi onwe-gi, Bet-lehem Efrata, nke di ntà idi n'etiti usu nile nke nnù abua na ọgu iri nke Juda, nime gi ka otù onye gēsi putaram ibu onye nāchi achi n'Israel; onye ọpupu-ya nile sitere na mb͕e ochie, site n'ubọchi nile nke mb͕e ebighi-ebi gara aga.


N'ihi na Chineke huru uwa n'anya otú a, na Ọ nyere ọbuná Ọkpara Ọ muru nání Ya, ka onye ọ bula nke kwere na Ya we ghara ila n'iyì, kama ka o nwe ndu ebighi-ebi.


Onye nēkwu site n'onwe-ya nāchọ otuto nke aka ya: ma onye nāchọ otuto nke onye zitere ya, onye ahu bu onye ezi-okwu, ajọ omume adighi kwa nime ya.


Jisus zara, si, Ọ buru na Mu onwem enye Onwem otuto, otuto nkem bu ihe-efu: Nnam bu Onye nēnyem otuto; Onye unu onwe-unu nāsi, na Ọ bu Chineke-unu;


na Chineke emezuwo nka n'ebe umu-ayi nọ, ebe O mere ka Jisus bilie; dika edewo-kwa-ra ya n'abù ọma nke-abua, si, Ọkparam ka Gi onwe-gi bu, Mu onwem amuwo Gi ta.


N'ihi na ihe iwu ahu nāpughi ime, nke ọ nādighi ike nime ya site n'anu-aru, Chineke mere, n'ihi na Ọ mara nmehie ikpé n'anu-aru, mb͕e O zitere Ọkpara nke aka Ya n'oyiyi nke anu-aru nmehie na dika àjà achuru n'ihi nmehie:


Chineke, mb͕e Ọ gwarari nna-ayi-hà okwu n'oge ochie nime ndi-amuma n'iberibe-akwukwọ di iche iche na uzọ di iche iche,


N'ihi na ọ̀ bu onye n'etiti ndi-mọ-ozi ka Ọ siri mb͕e ọ bula, Ọkparam ka Gi onwe-gi bu, Mu onwem amuwo Gi ta? ọzọ kwa, Mu onwem gāburu Ya Nna, Ya onwe-ya gābu-kwa-ram Ọkpara?


O sitere na ya ji ugwọ ka eme ka O yie umu-nna-Ya n'ihe nile, ka O we ghọ onye-isi-nchu-àjà di ebere, Onye kwesi-kwa-ra ntukwasi-obi, n'ihe nile diri Chineke, ka O we me ka obi Chineke juru n'ebe nmehie nile nke ndi nke Ya di.


Ya mere, umu-nnam di nsọ, ndi nketa nke ọkpukpọ nke elu-igwe, tugharinu uche n'Onye-ozi na Onye-isi-nchu-àjà nke nkwuputa-ayi, bú Jisus;


Onye Chineke nyere aha onye-isi-nchu-àjà dika usoro Melkizedek si di.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan