10 Onye Chineke nyere aha onye-isi-nchu-àjà dika usoro Melkizedek si di.
10 Ebe Chineke mere ya onyeisi nchụaja nʼusoro Melkizedek.
Melkizedek, bú eze Selem, we buputa achicha na manya-vine: onye ahu bu kwa onye-nchu-aja diri Chineke Nke kachasi ihe nile elu.
Jehova aṅuwo iyi, Ọ gaghi-echèghari kwa uche-Ya, Gi onwe-gi bu onye-nchu-àjà rue mb͕e ebighi-ebi Dika usoro Melkizedek si di.
O sitere na ya ji ugwọ ka eme ka O yie umu-nna-Ya n'ihe nile, ka O we ghọ onye-isi-nchu-àjà di ebere, Onye kwesi-kwa-ra ntukwasi-obi, n'ihe nile diri Chineke, ka O we me ka obi Chineke juru n'ebe nmehie nile nke ndi nke Ya di.
Ya mere, umu-nnam di nsọ, ndi nketa nke ọkpukpọ nke elu-igwe, tugharinu uche n'Onye-ozi na Onye-isi-nchu-àjà nke nkwuputa-ayi, bú Jisus;
Onye okwu ayi nwere ikwu bayere ya di uku, di kwa ike isughari asusu, ebe unu ghọworo ndi nwere nti ike.
n'ebe Jisus batara n'ihi ayi dika onye nēbu uzọ b͕a ọsọ, ebe emere Ya ka Ọ buru onye-isi-nchu-àjà rue mb͕e ebighi-ebi dika usoro nke Melkizedek si di.