Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Hibru 13:22 - Bible Nso

22 Ma ariọm unu, umu-nnam, nānagidenu okwu aririọ a: n'ihi na anamewere okwu ole-na-ole degara unu akwukwọ-ozi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

22 Ụmụnna m, arịọọ m unu, ka unu were ntachiobi nụrụ okwu agbamume m gwara unu nʼime akwụkwọ a na-etoghị ogologo.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Hibru 13:22
22 Iomraidhean Croise  

Ma mb͕e agusiri akwukwọ iwu na ndi-amuma, ndi-isi ulo-nzukọ ahu zigara ha ozi, si, Umu-nne-ayi, ọ buru na unu nwere okwu nkasi-obi igwa ndi-ayi, kwuenu.


Ma mu onwem Pọl ji idi-nwayọ na obi-ọma nke Kraist nāriọ unu, mu onye nādi ala n'iru unu mb͕e m'nọ n'etiti unu, ma mb͕e m'nānọghi enwem obi-ike n'ebe unu nọ:


Ya mere ayi bu ndi-ukọ̀ n'ọnọdu Kraist, dika agāsi na Chineke nāriọ aririọ site n'aka-ayi: ayi nọ n'ọnọdu Kraist nāriọ unu, menu ka unu na Chineke di n'otù.


Ma, dika ndi ayi na Ya nālukọ ọlu, ayi nāriọ kwa unu ka unu ghara inara amara Chineke n'efu,


Lenu otú nkpuru-akwukwọ m'ji aka nkem degara unu di okpotokpo.


na emere ka m'mara ihe-omimi ahu n'uzọ nkpughe, dika m'deworo n'akwukwọ a na mbu n'okwu ole-na-ole,


unu echezọsiwo kwa okwu nkasi-obi ahu, nke nāgwa unu okwu dika anāgwa umu-ndikom, si, Nwam, agula ya n'ihe ntà, bú ozizí Onye-nwe-ayi nēzí gi site n'inye gi ahuhu, Ada-kwa-la #mbà mb͕e Ọ nātu gi nmehie-gi n'anya;


Ma anamariọbiga unu ókè kari ime nka, ka ewe werem nyeghachi unu ọsọsọ kari.


N'ihi nka ayi aghaghi iṅabiga nti ókè kari n'ihe anuru, ka aghara ibupu ayi n'ebe ha di ma eleghi anya, dika miri nēbupu ub͕ọ.


Ya mere, umu-nnam di nsọ, ndi nketa nke ọkpukpọ nke elu-igwe, tugharinu uche n'Onye-ozi na Onye-isi-nchu-àjà nke nkwuputa-ayi, bú Jisus;


Ya mere ka ayi tua egwui ma, ebe nkwa ibà n'izu-ike-Ya fọduru, ọ di onye ọ bula n'etiti unu ọ gādi ka o rughi ya ma eleghi anya.


Ya mere ka ayi nānu ọku n'obi ibà n'izu-ike ahu, ka onye ọ bula ghara ida n'otù ihe-nṅomi ahu nke ekweyeghi-ekweye.


Site n'aka Silvanọs, nwa-nna-ayi kwesiri ntukwasi-obi, dika m'nāgu ya, ka m'nēdegara unu akwukwọ n'okwu ole-na-ole, nāriọ unu, nāb͕a kwa àmà na nka bu amara Chineke n'ezie: nēguzosinu ike nime ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan