Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Hibru 13:2 - Bible Nso

2 Unu echezọla ile ndi-ọbìa nke-ọma: n'ihi na ufọdu esitewo na nka le ndi-mọ-ozi ọbìa nāmaghi ama.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

2 Unu echefula ịnabata ndị ọbịa, nʼihi na ụfọdụ ndị mere nke a lekọtara ndị mmụọ ozi ma ha amataghị.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Hibru 13:2
21 Iomraidhean Croise  

Jehova we me ka ọ hu Ya anya n'etiti osisi terebinth nke Mamre, mb͕e ya onwe-ya nānọdu n'ọnu-uzọ ulo-ikwū-ya n'ikpo-ọku nke ehihie;


Abua nime ndi-mọ-ozi ahu we biarue Sọdọm n'anyasi; ma Lot nānọdu n'ọnu-uzọ-ama Sọdọm: Lot we hu ha anya, bilie izute ha, ọ da kpue iru-ya n'ala,


Ubọchi we rue, na Elaisha gabigara rue Shunem, ma otù nwayi uku nọ n'ebe ahu; o rugide ya ka o rie nri. O rue, mb͕e ọ bula ọ nāgabiga, na o wezugara onwe-ya ba n'ebe ahu iri nri.


Ọ buru na ahum madu nāla n'iyì site n'enweghi uwe, Ọ buru kwa na ob͕eye enweghi ákwà-nb͕okwasi;


Ọ bughi n'èzí ka ọbìa nānọ ọnọdu-abali; Anam emeghe ọnu-uzọm n'ebe uzọ-amá di.


Ọ̀ bughi ikèsara onye agu nāgu nri-gi, ka i me kwa ndi ewedara n'ala ndi nāwaghari awaghari ka ha bata n'ulo-gi? mb͕e i huru onye b͕a ọtọ, ka i kpuchie ya: ka i ghara kwa izonari onye-aru-gi onwe-gi?


Dika onye amuru n'ala site n'aru unu ka ọbìa gādiri unu, bú onye nọ dika ọbìa n'etiti unu, i gāhu kwa ya n'anya dika onwe-gi; n'ihi na ndi-ọbìa ka unu buri n'ala Ijipt: Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu.


n'ihi na agu gurum, unu we nyem ihe M'gēri: akpiri kpọrọm nku, unu we kuru miri nyem: abum ọbìa, unu we kpọbatam;


Eze ahu gāza kwa, si ha, N'ezie asim unu, Ka ọ ra, bú otú unu si me ya nye otù onye nime umu-nnam ndia, bú ndi dikarisiri ntà, Mu ka unu mere ya nye.


abum ọbìa, ma unu akpọbataghm; ab͕aram ọtọ, ma unu eb͕okwasighm ákwà; aru adighm ike, anọkwam n'ulo-nkpọrọ, ma unu eletaghm.


Mb͕e emere ya na èzí-na-ulo-ya baptism, ọ riọ ayi, si, Ọ buru na unu atulewo na abum onye kwere n'Onye-nwe-ayi, batanu n'ulom, nọgide n'ebe ahu. O we rugide ayi.


n'akuku ihe nākpà ndi nsọ, nēnwekọnu ihe; nāb͕asonu ọlu ile ndi-ọbìa anya nke-ọma.


Gaiọs, onye nēlem na nzukọ Kraist dum ọbìa, nēkele unu. Erastọs onye nāchi ihe obodo nēkele unu, na Kwọtọs nwa-nna-ayi.


Ya mere onye nēlekọta nzukọ Kraist anya aghaghi ibu onye anādighi-akalu, di nke otù nwunye, onye-anya-udo, onye uche-ya zuru okè, onye omume-ya kwesiri ekwesi, onye nēle ndi-ọbìa anya nke-ọma, onye nwere ike izí ihe;


onye anāb͕ara ya ezi àmà n'ọlu ọma; ọ buru na ọ zùputawo umu, ọ buru na o lewo ndi-ọbìa anya nke-ọma, ọ buru na ọ sawo ukwu ndi nsọ, ọ buru na o b͕owo nkpà ndi anākpab͕u, ọ buru na o sosiwo ezi ọlu nile ọ bula ike.


kama ọ ghaghi ibu onye nēle ndi-ọbìa nke-ọma, onye nāhu ezi ihe n'anya, onye uche-ya zuru okè, onye ezi omume, onye di ọcha n'obi, onye nējidesi onwe-ya ike;


nelērita onwe-unu ọbìa nke-ọma nātamughi ntamu:


Onye m'huru n'anya, i nēme ihe kwesiri ntukwasi-obi n'ọlu ọ bula i luru n'ebe ndi bu umu-nna-ayi, ndi bu kwa ndi-ọbìa, nọ;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan