Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Hibru 13:1 - Bible Nso

1 Ka ihu-n'anya-unu n'ebe umu-nna-unu nọ nādigide.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

1 Ka ịhụnanya unu nwere nʼetiti unu na-adịgide.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Hibru 13:1
30 Iomraidhean Croise  

Le, ka o si di nma, ka o si di kwa utọ nke-uku, Bú nbikọ nke umu-nne, ọbuná ibikọ n'otù!


Ihe ndia ka M'nēnye unu n'iwu, ka unu we hurita ibe-unu n'anya.


Mb͕e ubọchi Pentikọst nēzu okè, ha nile we nọkọ n'otù ebe.


Ma ọra ndi kwere na Kraist nwere otù obi na otù nkpuru-obi: ọ dighi kwa otù onye n'etiti ha nāsi na ihe ọ bula nime ihe nile o nwere bu nke aka ya; kama ha nwekọrọ ihe nile.


N'ihi na unu onwe unu, umu-nnam, ka akpọrọ ka unu nwere onwe-unu; nání unu ewerela inwe-onwe-unu ahu nye ka ọ buru ihe anu-aru-unu gēji me ihe kama werenu ihunanya burita orù ibe-unu.


Ma nkpuru nke Mọ Nsọ bu ihu-n'anya, ọṅù, udo, ogologo-ntachi-obi; obi-ọma, idi-nma, ikwesi-ntukwasi-obi,


N'ihi na nime Kraist Jisus ọ dighi ike ọ bula obibì-úgwù ma-ọbu ebìghi-úgwù nwere; kama nke nwere ike bu okwukwe nke sitere n'aka ihu-n'anya alusi ọlu ike.


nānu ọku n'obi idebe idi-n'otù nke Mọ Nsọ nime ihe-ọkiké nke bu udo.


nējeghari-kwa-nu n'ihu-n'anya, dika Kraist-ayi hu-kwa-ra unu n'anya, rara kwa Onwe-ya nye n'ihi ayi, dika ihe echere n'iru Chineke na àjà achuru nye Ya ka ọ buru isisì nke ihe ísì utọ.


Ayi ji ugwọ ikele Chineke ekele mb͕e nile bayere unu, umu-nna-ayi, dika o kwesiri, n'ihi na okwukwe-unu nāba uba nke-uku, ihunanya ahu unu nile n'otù n'otù nāhurita ibe-unu nēri kwa nne;


ka ayi nātugharita kwa uche n'aru ibe-ayi ikpasu ihu-n'anya na ọlu ọma di iche iche;


Ebe unu meworo nkpuru-obi-unu ka ha di ọcha n'iṅa-nti nke unu ṅara ezi-okwu, iwere ihu-n'anya nke iru-abua nādighi ya hu umu-nna-unu n'anya, sitenu n'obi-unu hurita onwe-unu n'anya si-ike:


Sọpurunu madu nile. Hunu òtù ndi bu umu-nna n'anya. Nātunu egwu Chineke. Nāsọpurunu eze-unu.


Ma n'ikpe-azu, nwekọnu otù uche, unu nile, werenu obi sorita onwe-unu hukọ ahuhu, burunu ndi nāhu umu-nna-unu n'anya, ndi nwere obi ọmiko, ndi nwere uche di ume-ala:


nke bu isi ihe nile menu ka ihu-n'anya ahu unu nāhurita onwe-unu di ike; n'ihi na ihu-n'anya nēkpuchi ọtutu nmehie:


nyezu kwa ihuunanya umu-nna nime nsọpuru-Chineke-unu; nyezu kwa ihu-n'anya nime ihu-n'anya-umu-nna-unu.


Nka bu kwa ihe O nyere n'iwu, ka ayi kwere n'aha nke Ọkpara-Ya Jisus Kraist, hurita kwa onwe-ayi n'anya, dika O nyere ayi iwu.


Ọ buru na onye ọ bula gāsi, Anamahu Chineke n'anya, ma ọ nākpọ nwa-nne-ya asì, ọ bu onye-ugha: n'ihi na onye nādighi-ahu nwa-nna-ya n'anya, bú onye ọ huworo, ọ pughi ihu Chineke n'anya, bú Onye ọ nāhughi mb͕e ọ bula.


Ma enwerem nka imegide gi, na i rapuru ihu-n'anya ahu i nwere na mbu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan