Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Hibru 12:9 - Bible Nso

9 Ọzọ kwa, ayi nwere ndi bu nna nke anu-aru-ayi izí ayi ihe site n'inye ayi ahuhu, ayi we sọpuru ha: àyi agaghi-edo kari onwe-ayi nke-uku n'okpuru Nna nke mọ-ayi, we di ndu?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

9 Dịka ịma atụ, ndị bụ nna anyị site nʼanụ ahụ na-apịa anyị ụtarị mgbe ọbụla anyị nupuru isi. Ma nke a adịghị egbochi anyị ịsọpụrụ ha. O kwesikwaghị ka anyị rubere Nna nke mmụọ isi karịa ma dịkwa ndụ? Anyị mee nke a, anyị ga-adị ndụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Hibru 12:9
28 Iomraidhean Croise  

Onye nkpuru-obi nke ihe ọ bula di ndu di n'aka-Ya, Ya na mọ nke anu-aru nile nke madu.


Sọpuru nna-gi na nne-gi: ka ubọchi-gi we di anya n'elu ala ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi.


Anya nke nākwa nna-ya emò, Nke nēleda kwa iṅa nne-ya nti, Ugolo-ọma nke ndagwurugwu gāghuputa ya, Umu-ugo gēri kwa ya.


ájá ewe laghachi n'ala dika o si diri, mọ alaghachikuru kwa Chineke Onye nyere ya.


Onye-nwe-ayi, ihe ndia ka madu ji adi ndu, Ọ bu kwa nime ha ka ndu mọm dichasi: I gēme kwa ka aru dim ike; Gi me kwa ka m'di ndu.


Otú a ka Chineke, bú Jehova, siri, bú Onye kèworo elu-igwe, seti kwa ha; Onye meworo uwa na ihe nile nke si nime ya aputa ka ọ sa mbara; Onye nēnye ndi bi n'elu ya ume ha nēku, Onye nēnye kwa ndi nējeghari nime ya mọ:


Ahuhu gādiri onye nāsi nna-ya, Gini ka i nāmu? nke nāsi kwa nwanyi, Ìme gini nēme gi?


N'ihi na ọ bughi rue mb͕e ebighi-ebi ka M'gānalu ọ̀gù, ọ bughi kwa rue mb͕e nile ka M'ganēwe iwe: n'ihi na mọ gāda #mbà n'irum, ya na nkpuru-obi nile Mu onwem meworo.


Nna na nne ka ha lelìworo nime gi; ọbìa ka ha jiworo nmeb͕u emeso n'etiti gi: nwa-nb͕ei na nwanyi di-ya nwuru ka ha meworo ihe-ike nime gi.


Unu gātu egwu, onye ọ bula ọ tua egwu nne-ya na nna-ya, unu gēdebe kwa ubọchi-izu-ikem nile: Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu.


Ibu okwu Jehova eboro Israel. Ihe si n'ọnu Jehova puta, bú Onye nēseti elu-igwe, nātọ kwa ntọ-ala uwa, nākpu kwa mọ madu nime ya:


Nwa nāsọpuru nna-ya, orù nāsọpuru kwa onye-nwe-ya: ọ buru kwa na nna ka M'bu, òle ebe nsọpurum di? ọ buru kwa na onye-nwe-madu ka M'bu, òle ebe egwum di? ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri unu, unu ndi-nchu-àjà, ndi nēlelì aham. Ma unu asiwo, Nìme gini ka ayi lelìworo aha-Gi?


Ha we da kpue iru-ha n'ala, si, Chineke, bú Chineke nke mọ nile na anu-aru nile, bú madu, nwere, asi na otú nwoke emehie, Ì gēwesa kwa nzukọ a nile iwe?


Ka Jehova, bú Chineke nke mọ anu-aru nile, bú madu, nwere, Ya me otù nwoke ka ọ buru onye-nlekọta nzukọ a,


si, Otù onye-ikpé nọ n'otù obodo, onye nādighi-atu egwu Chineke, nke nādighi-asọpuru kwa madu:


Ma na mbu ọ chọghi ime ya: ma emesia ọ siri n'onwe-ya, Ọ bu ezie na adighi m-atu egwu Chineke, adighm-asọpuru kwa madu;


Nke amuworo site n'anu-aru bu anu-aru; nke amuwo-kwa-ra site na Mọ Nsọ bu mọ.


Ya mere ebe ọ bu onye-amuma, mata kwa na Chineke ṅuru ya-ri iyi, na Ọ gēwere otù Onye nime ndi bu nkpuru si ya n'afọ puta me ka Ọ nọkwasi oche-eze-ya;


bayere Okpara-Ya, Onye amuru site na nkpuru Devid dika anu-aru si di,


N'ihi na anamekperi ekpere, ka mu onwem buru anathema pua n'ebe Kraist nọ n'ihi umu-nnem, ndi-ikwum dika anu-aru si di:


ndi nwe nna-ayi-hà, ndi Kraist-ayi si kwa n'etiti ha puta dika anu-aru si di, Onye bu Onye-isi ihe nile, bu kwa Chineke, Nke agọziworo rue mb͕e nile ebighi-ebi. Amen.


Onye anābu ọnu ka ọ bu, bú onye nēlelì nna-ya ma-ọbu nne-ya. Ndi Israel nile gāsi kwa, Amen.


Wedanu onwe-unu n'iru Onye-nwe-ayi, Ọ gēweli kwa unu elu.


Ya mere donu onwe-unu n'okpuru Chineke; ma guzogidenu ekwesu, ọ gāb͕apu kwa n'ebe unu nọ.


Ya mere wedanu onwe-unu n'okpuru aka di ike nke Chineke, ka O we welie unu elu n'oge nke Ya;


O we sim, Okwu ndia kwesiri ntukwasi-obi, buru kwa ezi-okwu: Onye-nwe-ayi, bú Chineke nke ndi-mọ nke ndi-amuma, zite-kwa-ra mọ-ozi-Ya igosi ndi-orù-Ya ihe nile nāghaghi iputa na mb͕e ntà.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan