Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Hibru 12:7 - Bible Nso

7 Nātachinu obi ka ewe zí unu ihe site n'inye unu ahuhu; n'ihi na Chineke nēmeso unu dika umu; n'ihi na ònye bu nwa ahu nna-ya nādighi-ezi ya ihe site n'inye ya ahuhu?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

7 Tachie obi, mụta ihe site nʼahụhụ. Nʼihi na Chineke na-emeso unu mmeso dị ka nna ọbụla hụrụ ụmụ ya nʼanya si emeso ha mmeso. Nwata ọbụla adịghị nke nna ya na-adịghị abara mba.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Hibru 12:7
16 Iomraidhean Croise  

Mu onwem gāburu ya nna, ya onwe ya gābu-kwa-ram nwa: ọ buru na ọ me ajọ omume, M'gēwere nkpa-n'aka madu, were kwa ihe-otiti nke umu madu, dua ya ọdu;


Ma ọ dighi mb͕e nna-ya mere ihe nēwuta ya n'ubọchi ndu-ya nile, si, Gini mere i meworo otú a? ọzọ kwa, onye ahu bu onye di nma n'aru nke-ukwu; nne-ya mu-kwa-ra ya mb͕e amusiri Absalom.


Onye nēb͕ochi nkpa-n'aka-ya nākpọ nwa-ya asì: Ma onye nāhu ya n'anya nādọsi ya aka na nti ike.


Dọ nwa-gi aka na nti, n'ihi na olile-anya di; Atukwasi-kwa-la obi-gi n'ime ka ọ nwua.


Uche b͕agọrọ ab͕agọ bu ihe ekekọtaworo n'obi nwata; Ma nkpa-n'aka nke idọ-aka-na-nti gēme ka ọ di anya n'ebe ọ nọ.


Nkpa-n'aka na iba-nba nēnye amam-ihe: Ma nwata nke anārapu n'onwe-ya nēme ka ihere me nne-ya.


Dọ nwa-gi aka na nti, ọ gēme kwa ka i zu ike; E, ọ gēnye nkpuru-obi-gi ihe-utọ.


nēme ka nkpuru-obi ndi nēso uzọ Jisus guzosie ike, nāriọ ha ka ha nọgide n'okwukwe-ayi, nēgosi kwa na ayi aghaghi isite n'ọtutu nkpab͕u ba n'ala-eze Chineke.


Ma mb͕e anēkpe ayi ikpé, Onye-nwe-ayi nēzí ayi ihe, site n'inye ayi ahuhu, ka ewe ghara imakọ ayi na uwa ikpé.


I gāma kwa n'obi-gi, na, dika nwoke si adọ nwa-ya nwoke aka na nti, otú a ka Jehova, bú Chineke-gi, nādọ gi aka na nti.


N'ìhi gini ka unu nāzọkwasi àjàm ukwu, zọkwasi kwa onyinye-inata-iru-ọmam, nke M'nyeworo n'iwu n'ebe-obibim; i we nāsọpuru umu-gi ndikom karim, ime onwe-unu ka unu ma abuba site n'ihe kachasi nma nke onyinye-inata-iru-ọma ọ bula nke Israel, bú ndim?


Nka gābu-kwa-ra gi ihe-iriba-ama, nke gābiakwasi umu-gi abua, bú Họfnai na Finehas; n'otù ubọchi ka ha abua gānwu.


Egosiwokwam ya na Mu onwem nēkpe ulo-ya ikpe rue mb͕e ebighi-ebi, n'ihi ajọ omume nke ọ mara, n'ihi na umu-ya ndikom nēwetara onwe-ha nkọcha, ma o b͕ochighi ha.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan