Ma ọ gēru, mb͕e ha gāsi gi, N'ìhi gini ka gi onwe-gi nēze ume? na i gāsi, Ọ bu n'ihi akukọ, n'ihi na ọ nābia: obi nile ọ bula gālọ kwa miri, aka nile gākuda, ike gāgwu mọ madu nile ọ bula, ikperè-ukwu nile gāghọ miri miri: le, ọ nābia, o ruwo kwa, ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.
Mb͕e ahu ib͕u-maramara nke iru eze b͕anwere, èchìchè-ya nile nēme kwa ka ọ ma jijij; nkwonkwo úkwù-ya nātọpusi kwa, ikperè-ya abua nākukọrita kwa onwe-ha.
Ọ bu ihe tọb͕ọrọ n'efu, na ihe awusiri dika miri, na ihe ab͕abara ọtọ: obi alọwo kwa miri, isu-ngọngọ nke ikperè abua di kwa, nb͕ali di kwa n'úkwù nile, iru ha nile achagharisiwo kwa.
Ma ayi nāriọ unu, umu-nna-ayi, nādunu ndi nādighi-agazi ije ọdú, nakasinu ndi dara #mbà n'obi, nēyerenu ndi nādighi ike aka, nwenu ogologo-ntachi-obi n'ebe madu nile nọ.
na n'ihi ya, tugharianu uche n'Onye ahu Nke tachiworo obi na nkwugide di otú a, bú nke ndi-nmehie nēkwugide onwe-ha, ka ike ghara igwu unu, unu we da #mbà na nkpuru-obi-unu.
unu echezọsiwo kwa okwu nkasi-obi ahu, nke nāgwa unu okwu dika anāgwa umu-ndikom, si, Nwam, agula ya n'ihe ntà, bú ozizí Onye-nwe-ayi nēzí gi site n'inye gi ahuhu, Ada-kwa-la #mbà mb͕e Ọ nātu gi nmehie-gi n'anya;