Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Hibru 11:5 - Bible Nso

5 Okwukwe ka eji būbiga Inok ka ọ ghara ihu ọnwu; ahughi kwa ya, n'ihi na Chineke bubigara ya-ri: n'ihi na mb͕e akēbubigaghi ya ab͕aworo ya àmà na ihe ọ nēmeri nātọ Chineke ezi utọ:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

5 E sitere nʼokwukwe kupu Enọk nke pụtara na ọ nwụghị anwụ, a hụkwaghị ya ọzọ nʼihi na Chineke akpọrọla ya. Ma tupu e kuru ya, e mere ka anyị mara na ọ mere ihe masịrị Chineke.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Hibru 11:5
17 Iomraidhean Croise  

O rue, mb͕e Jehova gaje ime ka Elaija rigorue elu-igwe n'oké ifufe, na Elaija siri na Gilgal je, ya na Elaisha.


O rue na, mb͕e ha nọ nēje, nēje ije nēkwu kwa okwu, le, ub͕ọ-ala ọku na inyinya ọku, nke kewara ha abua; Elaija we rigorue elu-igwe n'oké ifufe.


Òle nwoke ọ bu nke gādi ndu, ghara ihu ọnwu anya, Nke gēme ka nkpuru-obi-ya wepuga onwe-ya n'aka ala-mọ? Selah


Eze we nye Jeramil nwa eze na Seraia nwa Azriel na Shelemaia nwa Abdeel iwu iwere Beruk, bú ode-akwukwọ, Jeremaia, bú onye-amuma: ma Jehova zobere ha.


Mọ Nsọ duru ya-ri ọdu, na ọ gaghi-ahu ọnwu, rue mb͕e ọ gāhu Kraist nke Onye-nwe-ayi.


nwa Metusela, nwa Inok, nwa Jered, nwa Mahalaleel, nwa Kenan,


kama dika Chineke nwaputaworo ayi ka enye ozi ọma Ya n'aka-ayi na ntukwasi-obi idebe, otú a ka ayi nēkwu; ọ bughi dika ndi nēme ihe gātọ madu utọ, kama dika ndi nēme ihe gātọ Chineke utọ, bú Onye nānwa obi-ayi.


ma asi na okwukwe adighi ọ bu ihe anāpughi ime, bú ime ihe gātọ Chineke ezi utọ: n'ihi na onye nābiakute Chineke aghaghi ikwe na Ọ di, na Ọ nēgosi kwa Onwe-ya Onye nēnyeghachi ndi nāchọ Ya ugwọ-ọlu.


Ma Onye ahu Nke emere Ya ka ọ di kari ndi-mọ-ozi ala nke-ntà, bú Jisus, Ya ka ayi nēle anya, na ejiwo ebube na nsọpuru kpube Ya n'isi dika okpu-eze n'ihi ahuhu nke ọnwu, ka O we site n'amara Chineke detu ọnwu ire n'ihi madu nile ọ bula.


ihe ọ bula ayi nāriọ kwa, ayi nānata ya n'aka-Ya, n'ihi na ayi nēdebe ihe nile Ọ nyere n'iwu, ayi nēme kwa ihe nile nātọ utọ n'iru Ya.


Ọ bu kwa ndia ka Inok, bú onye-asa site n'Adam, buru amuma, si, Le, Onye-nwe-ayi biara Ya na ndi nsọ Ya, anāpughi iguta ọnu,


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan