Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Hibru 10:5 - Bible Nso

5 N'ihi nka mb͕e Ọ nābia n'uwa, Ọ si, Àjà na ihe echere n'iru Gi, I chọghi ha, Ma aru ka I kwadebere nyem;

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

5 Ya mere mgbe Kraịst bịara nʼụwa, ọ sịrị, “Aja na onyinye abụghị ihe ị chọrọ kama ị kwadoro ahụ nye m.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Hibru 10:5
26 Iomraidhean Croise  

iro ka M'gētiye kwa n'etiti gi na nwayi ahu, na n'etiti nkpuru-gi na nkpuru-ya: nkpuru ahu gēchifia gi n'isi, gi onwe-gi gēchifia kwa ya n'ikiri-ukwu.


Jehova nāsi, N'ìhi gini ka unu nāchurum ọtutu àjà-unu? afọ ejuwom n'àjà-nsure-ọku nile eji ebulu chu, na abuba umu-ehi emere ka ha ma abuba; ọzọ, ọbara oke-ehi na nke umu-aturu na nke nkpi atọghm utọ.


Lebanon ezughi kwa isure ọku, anu-ọhia-ya ezughi kwa isure àjà-nsure-ọku.


N'ihi nka Onye-nwe-ayi onwe-ya gēnye unu ihe-iriba-ama; le, nwa-ab͕ọghọ ahu di ime, ọ gaje kwa imu nwa-nwoke, ọ gākpọ kwa aha-ya Immanuel.


Rùe ole mb͕e ka i ganēje iru na azu, gi ada nke nādaghachi azu? n'ihi na Jehova ekèwo ihe -ohu n'uwa, Nwanyi gānọ nwoke buruburu.


N'ìhi gini kwa ka frankincense ji biakutem site na Sheba, calamus ọma kwa site n'ala di anya? àjà-nsure-ọku-unu, ha abughi ihe natọ utọ, àjà-unu kwa, ha atọghm utọ.


si Ya, Gì onwe-gi bu Onye nābia, ma-ọbu na ayi nēle anya onye di iche?


Mọ-ozi ahu we za, si ya, Mọ Nsọ gābiakwasi gi, ike nke Onye kachasi ihe nile elu gēkpuchi kwa gi: n'ihi nka Ihe di nsọ nke i di ime Ya, agākpọ Ya Ọkpara Chineke.


Jọn we kpọ madu abua biakute ya nime ndi nēso uzọ-ya, zigara Onye-nwe-ayi, si, Gì onwe-gi bu Onye nābia, ma-ọbu na ayi nēle anya onye ọzọ?


Okwu ahu we ghọ anu-aru, bú madu, O we biri n'etiti ayi, (ayi kiri-kwa-ra otuto-Ya, bú otuto dika otù nwa-nwoke amuru nání ya nānata n'aka nna-ya), O juputara n'amara na ezi-okwu.


ma mb͕e oge ahu zuru, Chineke ziputara Ọkpara-Ya, Onye amuru site na nwanyi, Onye amuru n'okpuru iwu,


Ọ bu kwa ihe anēkwuputa na ọ di uku, bú ihe-omimi nke nsọpuru-Chineke; Onye ahu Nke emere ka Ọ puta ìhè n'anu-aru, Nke aguru Ya n'onye ezi omume nime mọ, Nke emere ka ndi-mọ-ozi hu Ya anya, Nke ekwusara Ya n'etiti ndi mba ọzọ, Nke ekwere na Ya nime uwa, Nke anara Ya n'elu nime ebube.


Ma ọzọ kwa, mb͕e ọ bula Ọ gākpọbatawori Ọkpara ahu n'elu-uwa ebe madu bi, Ọ si, Ka ndi-mọ-ozi nile nke Chineke kpọ kwa isi ala nye Ya.


Ọ bu kwa n'ọchichọ a ka edoworo ayi nsọ site n'iche aru Jisus Kraist n'iru Chineke dika àjà nání otù mb͕e.


Mb͕e ahu ka M'siri, Le, abiawom (N'akwukwọ-npiakọta ka edeworo ihe bayerem) Ime ihe I nācho, Chineke.


Mb͕e O buru uzọ kwu, si, Àjà na ihe echere n'iru Gi na àjà-nsuresi-ọku na àjà achuru bayere nmehie, I chọghi ha, ha abughi kwa ihe di Gi ezi nma (bú ihe anēche n'iru Chineke dika iwu si di),


Ya mere ebe umu-ntakiri ahu bu ndi nēnwekọ anu-aru na ọbara, Ya onwe-ya n'otù uzọ ahu keta-kwa-ra ihe ndia; ka O we site n'ọnwu me ka onye ahu ghara idi irè, bú onye nwere ike nke ọnwu, ya bu ekwensu;


Onye n'ubọchi nke anu-aru-Ya, mb͕e Ọ weresiri ikwa-ákwá siri ike na anya-miri che ekpere na aririọ n'iru Onye ahu puru izọputa Ya n'ọnwu, mb͕e anusi-kwa-ra olu-Ya n'ihi na Ọ turu egwu Chineke,


N'ihi na anēdo onye-isi-nchu-àjà ọ bula iche onyinye na àjà di iche iche n'iru Chineke: o sitere na nka di nkpà ka Onye-isi-nchu-àjà nka nwe kwa ihe iche n'iru Chineke.


Onye Ya onwe-ya, dika àjà achuru, būru nmehie nile ayi n'aru-Ya n'elu osisi ahu, ka ayi, ebe ayi nwuworo n'ebe nmehie nile di, ka ayi we di ndu n'ebe ezi omume di; Onye eji ọnyá-utari-Ya me ka unu nwe ezi ndu.


N'ihi na ọtutu ndi-nduhie apuwo ba nime uwa, bú ndi nādighi-ekwuputa na Jisus Kraist nābia n'anu-aru. Nka bu onye-nduhie ahu na onye ahu nēmegide Kraist.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan