Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Hibru 10:38 - Bible Nso

38 Ma onye ezi omume nkem gēsite n'okwukwe di ndu: Ọ buru kwa na ọ gēwezuga onwe-ya, ihe-ya adighi nkpuru-obim ezi nma.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

38 Ma, “Onye ezi omume nkem ga-esite nʼokwukwe dị ndụ. Mkpụrụobi m agaghị e nwee mmasị nʼime onye ọbụla na-alaghachi azụ.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Hibru 10:38
24 Iomraidhean Croise  

N'ihi na edebewo uzọ nile nke Jehova, Emebighkwam iwu n'ipu n'aka Chinekem.


Ihe nātọ Jehova utọ bu ndi nātu egwu Ya, Ndi nēchere ebere-Ya.


N'ihi na ihe ndi-Ya nātọ Jehova utọ: Ọ gēji nzọputa chọ ndi di ume-ala n'obi nma.


N'ihi na ọ bughi Chineke nke nmebi-iwu nātọ utọ ka I bu: Ihe ọjọ agaghi-anọ dika ọbia n'ebe I nọ.


M'gānu ihe Chineke, bú Jehova, gēkwu: N'ihi na Ọ gāgwa ndi-Ya, gwa kwa ndi-ebere-Ya, okwu udo: Ma ka ha ghara ilaghachi ba n'ihe-nzuzu.


Le orùm, onye M'nējide aka; onye nkem M'rọputara, onye ihe-ya tọrọ nkpuru-obim utọ: atukwasiwom ya Mọm; ikpé ka ọ gēweputara mba nile.o


ma mb͕e onye ezi omume si n'ezi omume-ya chigharia, me ajọ omume, me dika ihe-árú nile si di nke onye nēmebi iwu meworo, ọ̀ gādi kwa ndu? Ezi omume-ya nile nke ọ meworo, agaghi-echeta ha: n'ihe-nmekpu-ya nke o mekpuworo, na nime nmehie-ya nke o mehieworo, nime ha ka ọ gānwu.


Ọzọ, mb͕e onye ezi omume si n'ezi omume-ya chigharia, we me ajọ omume, M'we tiye ihe-isu-ngọngọ n'iru ya, onye ahu gānwu; n'ihi na i dọghi ya aka na nti, ọ bu na nmehie-ya ka ọ gānwu, agaghi-echeta kwa ezi omume-ya nile nke o meworo; ma n'aka-gi ka M'gājuta ọbara-ya.


Mb͕e M'nāsi onye ezi omume, na ọ ghaghi idi ndu, onye ahu ewe tukwasi obi n'ezi omume-ya, me ajọ omume, ezi omume-ya nile, agaghi-echeta ha; ma n'ajọ omume-ya nke o meworo, nime ya ka ọ gānwu.


Le, nkpuru-obi-ya afuliwo onwe-ya, o zighi ezi nime ya: ma onye ezi omume gēji okwukwe-ya di ndu.


na ndi si n'iso Jehova laghachi azu; na ndi nāchọghi Jehova, nājughi kwa ase Ya.


Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na otù onye di n'etiti unu nke nēmechi uzọ, ka unu we ghara ifunwu ọku nke ebe-ichu-àjàm n'efu! ọ dighi ihe-unu nātọm utọ, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri, M'gaghi-anara kwa onyinye-inata-iru-ọma n'aka-unu nke-ọma.


Le, Onye nējerem ozi Onye M'rọputara; Onye M'huru n'anya, Onye ihe-Ya di nkpuru-obim ezi nma: M'gātukwasi Ya Mọ nkem, Ọ gākọ-kwa-ra mba nile akukọ ikpé.


ma o nweghi nkpọrọgwu nime onwe-ya, kama ọ nānọ nwa oge; ma mb͕e nkpab͕u ma-ọbu nsob͕u putara n'ihi okwu ahu, ngwa ngwa ọ ma n'ọnyà.


N'ihi na anēkpughe ezi omume Chineke nime ya, site n'okwukwe rue okwukwe: dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ, si, Ma onye ezi omume gēsite n'okwukwe di ndu.


Ma ọ putara ìhè na ọ dighi onye ọ bula anāgu n'onye ezi omume n'iwu n'iru Chineke: n'ihi na, Onye ezi omume gēsite n'okwukwe di ndu;


ndi b͕uru Onye-nwe-ayi Jisus na ndi-amuma, chupu kwa ayi, ha bu kwa ndi ihe ha nēme nātọghi Chineke utọ, ha nēmegide kwa madu nile;


Ma ayi onwe-ayi adighi n'etiti ndi wezugara onwe-ha ila n'iyì; kama ayi di n'etiti ndi kwere ekwe inweta nkpuru-obi-ha.


Unu mara ikpé, unu b͕uru onye ezi omume ahu; ọ dighi-edo onwe-ya imegide unu.


Ha siri n'etiti ayi pua, ma ha abughi ndi nke ayi; n'ihi na asi na ha bu ndi nke ayi, ha gānọgidewori n'etiti ayi: ma ha puru, ka ewe me ka ha puta ìhè na ha nile bu ndi nābughi ndi nke ayi.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan