N'ubọchi ahu Ijipt gādi ka ndinyom: ọ gāma kwa jijiji tu kwa egwu n'ihi nfeghari aka nke Jehova nke usu nile nke ndi-agha, nke Ya onwe-ya nēfeghari n'elu ya.
Ub͕u a, le, aka Onye-nwe-ayi di kwa n'aru gi, i gēkpu kwa ìsì, nāhughi anyanwu nwa oge. Ngwa ngwa alulu na ọchichiri dakwasiri ya; o we nējeghari nāchọ ndi gējide ya n'aka idu ya.
Ya mere ebe ayi matara egwu Onye-nwe-ayi, ayi nēme ka madu kweye, ma emewo ka ayi puta ìhè nye Chineke; anamatukwasi kwa obi na emewo ka ayi puta kwa ìhè nime akọ-na-uche-unu.