Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Hibru 10:24 - Bible Nso

24 ka ayi nātugharita kwa uche n'aru ibe-ayi ikpasu ihu-n'anya na ọlu ọma di iche iche;

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

24 Ka anyị tụgharịa uche otu anyị ga-esi kpalie ibe anyị nʼịhụnanya na ezi ọrụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Hibru 10:24
29 Iomraidhean Croise  

Onye ihe nāgara nke-ọma ka ọ bu, bú onye nwere uche n'imeso onye nēnweghi ike: N'ubọchi ihe ọjọ Jehova gēme ka ọ wepuga onwe-ya.


Onye ezi omume nāmata okwu-ikpe nke ndi nēnweghi ike: Onye nēmebi iwu adighi-aghọta ihe-ọmuma.


Ndi nēso uzọ Jisus, onye ọ bula ka ihe o nwere ra, we zube izigara umu-nna nime Kraist ndi bi na Judia ihe iyere ha aka:


Ma gini ka ndum-ọdu Chineke nāgwa Ya? Arapurum nye Onwem nnù ndikom iri-na-asa na ọgu iri, madu ndi ọ dighi mb͕e ha b͕uru ikperè nye Beal.


Nēsonu ndi nāṅuri n'iṅuri ọṅu; nēsonu ndi nākwa ákwá n'ikwa ákwá.


dika mu onwem nēme kwa ihe nātọ madu nile n'ihe nile, nāchọghi urù nke akam, kama urù nke madu nile, ka ewe zọputa ha.


N'ebe ndi nādighi ike nọ m'ghọrọ onye nādighi ike, ka m'we rita ndi nādighi ike n'urù: aghọwom ihe nile n'ebe madu nile nọ, ka m'we si n'uzọ ọ bula zọputa ufọdu.


Ekwughm n'uzọ inye iwu, kama n'iwere inu-ọku-n'obi nke ndi ọzọ nwaputa kwa ihu-n'anya-unu na ọ bu ezi ihu-n'anya.


n'ihi na amataram obi di ọku unu, nke m'nānyara ndi Masedọnia isi bayere unu, na Akaia akwadebewo n'arọ gara aga; inu-ọku-unu kwali-kwa-ra obi ndi ka n'ọnu-ọgugu nime ha.


N'ihi na unu onwe unu, umu-nnam, ka akpọrọ ka unu nwere onwe-unu; nání unu ewerela inwe-onwe-unu ahu nye ka ọ buru ihe anu-aru-unu gēji me ihe kama werenu ihunanya burita orù ibe-unu.


Ma nkpuru nke Mọ Nsọ bu ihu-n'anya, ọṅù, udo, ogologo-ntachi-obi; obi-ọma, idi-nma, ikwesi-ntukwasi-obi,


N'ihi na nime Kraist Jisus ọ dighi ike ọ bula obibì-úgwù ma-ọbu ebìghi-úgwù nwere; kama nke nwere ike bu okwukwe nke sitere n'aka ihu-n'anya alusi ọlu ike.


Umu-nnam, asi na ọ bu ezie na anwude madu mb͕e ọ nọ na ndahie ọ bula, unu onwe-unu, bú ndi Mọ Nsọ nāchi, menu ka madu di otú a guzozie nime mọ nke idi-nwayọ; nēlezi onwe-gi anya, ka aghara inwa kwa gi onwe-gi.


Kwenu ka okwu Kraist were àkù-ya nile biri nime unu n'amam-ihe nile; werenu abù ọma na ukwe na abù nke Mọ Nsọ nēzírita onwe-unu ihe, nādurita kwa onwe-unu ọdu, nime amara enyere unu nābùnu abù nime obi-unu nye Chineke.


ebe ayi nēcheta nēwepughi aka ọlu nke okwukwe unu na ndọb͕u-n'ọlu nke ihunanya unu na ntachi-obi nke olile-anya unu ji ele anya Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, n'iru Chineke-ayi, bú Nna-ayi;


N'ihi nka nākasiritanu ibe-unu obi, wulirita kwa ibe-unu elu dika ulo, dika unu nēme kwa.


ọ bughi na ayi enweghi ike, ma ọ bu ka ayi we were onwe-ayi mere unu ihe-atù, ka unu we ṅomi ayi.


ka ha nēme ezi ihe, ka ha buru ọgaranya n'ọlu ọma nile, ka ha buru ndi kwadebeworo ime ka ndi ọzọ keta ihe ha nwere, ka ha buru ndi kwere ka ndi ọzọ so ha nwekọ ihe;


ka ha we me ka ndi bu umu-ab͕ọghọ nwe uche zuru okè ibu ndi nāhu di-ha n'anya, ndi nāhu umu-ha n'anya,


Okwu a kwesiri ntukwasi-obi, anamezube kwa ka i kwusie okwu bayere ihe ndia ike, ka ndi kweworo okwu Chineke we tukwasi uche n'ibu ndi-isi n'ọlu ọma. Ihe ndia di nma buru kwa ihe bara madu urù:


Ka ihu-n'anya-unu n'ebe umu-nna-unu nọ nādigide.


Nēchetanu ndi nọ n'ab͕u, dika ndi ekekọworo unu na ha n'ab͕u; nēchetanu ndi anēmejọ, dika ndi unu onwe-unu nọ kwa n'aru.


kama nāriọritanu ibe-unu aririọ kwa-ubọchi, n'ogologo oge a anākpọ ya Ta; ka obi onye ọ bula n'etiti unu ghara ime etili site n'aghughọ nke nmehie:


Umu-ntakirim, ka ayi ghara ihu n'anya n'okwu, ma-ọbu n'ire; kama ka ayi nāhu n'anya n'ọlu na ezi-okwu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan