Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Hibru 10:23 - Bible Nso

23 ka ayi jidesie nkwuputa nke olile-anya-ayi ike ka ọ ghara iruda n'ala; n'ihi na Onye ahu Nke kwere nkwa kwesiri ntukwasi-obi:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

23 Ya mere, ka anyị jidesie nkwupụta nke olileanya anyị ike, nʼihi na onye ahụ kwere nkwa kwesiri ntụkwasị obi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Hibru 10:23
16 Iomraidhean Croise  

Kpem ikpe, Jehova, n'ihi na mu onwem ejewo ije n'izu-okèm: Ọ bu kwa na Jehova ka m'tukwasiworo obi, ukwum adighi-ab͕uchapu.


Ha di ọhu kwa-ututu; ihe riri nne ka ikwesi-ntukwasi-obi-Gi bu.


Chineke kwesiri ntukwasi-obi, Onye esitere n'aka Ya kpọbata unu na nnwekọ nke Ọkpara-Ya Jisus Kraist Onye-nwe-ayi.


Ọ dighi ọnwunwa ọ bula nwaworo unu ma-ọbughi nke madu nānagide: ma Chineke kwesiri ntukwasi-obi, Onye nāgaghi-ekwe ka anwa unu kari nke unu puru inagide; kama n'oge ọnwunwa ahu Ọ gēme kwa uzọ nb͕apu, ka unu we nwe ike inagide ya.


ebe ha ji nnwaputa nke ije-ozi a nēnye Chineke otuto n'ihi na edoro nkwuputa-unu n'okpuru ozi ọma Kraist, ya na n'ihi afọ-ofufo nke nnwekọ unu nēme ka ha na madu nile so unu nēnwekọ;


O kwesiri ntukwasi-obi, bú Onye ahu nākpọ unu, Onye gēme kwa ya.


Ma Onye-nwe-ayi bu onye kwesiri ntukwasi-obi, Onye gēme ka unu guzosie ike, che kwa unu ka unu ghara idabà n'aka ajọ onye ahu.


n'olile-anya nke ndu ebighi-ebi, nke Chineke, Onye nāpughi ikwu okwu-ugha, kwere nkwa ya tutu mb͕e ebighi-ebi erue;


Okwukwe ka Sera ji nara ike ọbuná imu nwa, ya onwe-ya, mb͕e ọ gasiri oge imu nwa, ebe ọ guru Ya n'Onye kwesiri ntukwasi-obi, bú Onye kwereri nkwa:


Ya mere, umu-nnam di nsọ, ndi nketa nke ọkpukpọ nke elu-igwe, tugharinu uche n'Onye-ozi na Onye-isi-nchu-àjà nke nkwuputa-ayi, bú Jisus;


n'ihi na ayi aghọwo ndi nketa nke Kraist, ma ọ buru na ọ bu ezie na ayi jidesiri nmalite nke ndabere-ayi ike rue ọgwugwu ihe nile:


ma Kraist kwesiri ntukwasi-obi dika Ọkpara, Nke bu onye-isi n'èzi-na-ulo-Ya; Onye ayi onwe-ayi bu èzi-na-ulo-Ya, ma ọ buru na ayi jidesie nkwuwa-okwu-ayi na inya-isi nke olile-anya-ayi ike rue ọgwugwu ihe nile.


Ya mere ebe ayi nwere Onye-isi-nchu-àjà di uku, Onye gabigaworo eluigwe nile, bú Jisus Ọkpara Chineke, ka ayi jidesie nkwuputa-ayi ike.


ka ayi we were ihe abua nādighi-agha, nke Chineke nāpughi ikwu okwu-ugha nime ha, nwe nkasi-obi siri ike, ayi, bú ndi b͕abàra ijidesi olile-anya ahu ike, bú nke edebere n'iru ayi;


Ma ya riọ n'okwukwe, ghara inwe obi abua: n'ihi na onye nwere obi abua yiri ebili-miri nke oké osimiri mb͕e ifufe nēfeghari ya, anātuli kwa ya elu.


Anamabia ọsọsọ: jidesie ihe i nwere ike, ka onye ọ bula ghara inara ọkpu-eze-gi.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan