Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Galeshịa 6:15 - Bible Nso

15 N'ihi na obibì-úgwù abughi ihe, ebìghi-úgwù abughi kwa ihe, kama ọ bu òkìkè ọhu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

15 Obibi ugwu abụghị ihe, ebighị ugwu abụghịkwa ihe, kama ị bụ onye e kere ọhụrụ bụ ihe dị mkpa.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Galeshịa 6:15
14 Iomraidhean Croise  

Ya mere ọ buru na onye ebìghi-úgwù nēdebe ihe nile iwu-gi guru n'ihe ziri ezi, àgaghi-agu ebìghi-úgwù-ya n'obibì-úgwù?


N'ihi na onye nke bu onye-Ju n'anya madu abughi onye-Ju; obibì-úgwù ahu nke madu nāhu anya, nke di n'anu-aru, abughi kwa obibì-úgwù:


Ya mere esitere na baptism-ayi likọ ayi na Ya ibà n'ọnwu ahu: ka, dika esitere n'ebube nke Nna-Ya me ka Kraist si na ndi nwuru anwu bilie, ka ayi onwe-ayi we jeghari kwa na ndu ọhu otú a.


Ya mere ub͕u a ọ dighi amam-ikpe ọ bula diri ndi nọ nime Kraist Jisus.


Obibì-úgwù abughi ihe, ebìghi-úgwù abughi kwa ihe; kama ọ bu idebe ihe nile Chineke nyere n'iwu.


Ya mere ọ buru na onye ọ bula di nime Kraist, ọ bu onye ekère ọhu: ihe ochie agasiwo; le, ha aghọwo ihe ọhu.


N'ihi na nime Kraist Jisus ọ dighi ike ọ bula obibì-úgwù ma-ọbu ebìghi-úgwù nwere; kama nke nwere ike bu okwukwe nke sitere n'aka ihu-n'anya alusi ọlu ike.


N'ihi na ayi bu ihe O mere, ndi ekère èkè nime Kraist Jisus ilu ezi ọ1u, nke Chineke buru uzọ dozie ka ayi we jegharia nime ha.


ebe ọ bu nime anu-aru-Ya ka O mere ka iro ahu ghara idi irè, bú iwu nke bu ihe di iche iche enyere n'iwu; ka O we were madu abua ahu kè otù madu ọhu nime onwe-ya, nēme ka udo di;


ka unu yikwasi kwa madu ọhu unu, nke ekère dika Chineke chọrọ nime ezi omume na idi-ọcha nke ezi-okwu ahu.


n'ihi na ayi onwe-ayi bu ndi obibì-úgwù, ndi ji Mọ nke Chineke nēkpe ekpere, ndi nānya kwa isi nime Kraist Jisus, ndi natukwasighi kwa obi n'anu-aru-ayi:


N'ihi na ndi ebìri úgwù ka ha bu, bú ndi nile putara n'Ijipt: ma ndi nile amuru n'ọzara n'uzo mb͕e ha siri n'Ijipt puta, ha ebìghi ha úgwù.


Onye ahu Nke nānọkwasi n'oche-eze ahu we si, Le, anameme ihe nile ka ha di ọhu. O we si, De akwukwọ: n'ihi na okwu ndia kwesiri ntukwasi-obi, buru kwa ezi-okwu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan