Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Galeshịa 5:3 - Bible Nso

3 Ma agwasim onye ọ bula ike, bú onye kwere ka ebì ya úgwù, na ọ bu onye ji ugwọ idebe iwu ahu dum.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

3 Ka m kwuokwa ya ọzọ, onye ọbụla kweere ka e bie ya ugwu ji ụgwọ idebezu iwu niile ahụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Galeshịa 5:3
19 Iomraidhean Croise  

ndi-eze-ayi, na ndi-isi-ayi, na ndi-nchu-àjà-ayi, na nna-ayi-hà, ha emeghi kwa iwu-Gi, ha aṅaghi kwa nti n'ihe nile I nyere n'iwu na n'àmà-Gi nile, nke I b͕ara megide ha.


Ahuhu gādiri unu, ndi-ndú ìsì, ndi si, Onye ọ bula nke gēji ulo nsọ Chineke ṅu iyí, ọ bughi ihe; ma onye ọ bula nke gēji ọla-edo nke ulo nsọ ahu ṅu iyí, o ji ugwọ.


Unu si kwa, Onye ọ bula nke gēji ebe-ichu-àjà ṅu iyí, ọ bughi ihe; ma onye ọ bula nke gēji ihe-onyinye di n'elu ya ṅu iyí, o ji ugwọ.


n'ihi na enwerem umu-nne ise; ka o we dọ ha aka na nti, ka ha onwe-ha ghara ibia kwa n'ebe nmekpa-aru a.


Madu ufọdu we si na Judia ridata we zí umu-nna nime Kraist ihe, si, Ọ buru na ebìghi unu úgwù dika ọme-n'ala nke Moses nyere si di, apughi izọputa unu.


O ji kwa ọtutu okwu ọzọ kwusie okwu ike, nāriọ kwa ha, si, Zọputanu onwe-unu n'ọb͕ọ a di nb͕agọ.


nāgwasi unu ike, ma ndi-Ju ma ndi-Grik, okwu nchèghari n'ebe Chineke nọ, na okwukwe n'ebe Onye-nwe-ayi Jisus nọ.


N'ihi na obibì-úgwù nāba urù ezie, ma ọ buru na i nēdebe iwu: ma ọ buru na i bu onye-njehie n'iwu, obibì-úgwù-gi aghọwo ebìghi-úgwù.


N'ihi na ka ha ra, bú ndi sitere n'ọlu nke iwu, ha nọ n'okpuru ọbubu-ọnu: n'ihi na edewo ya n'akwukwọ nsọ, si, Onye anābu ọnu ka ọ bu, bu onye ọ bula nke nānọgideghi n'ihe nile edeworo n'akwukwọ iwu, ime ha.


Le, mu onwem Pọl si unu, na, asi na unu ekwe ka ebì unu úgwù, Kraist agaghi-abara unu urù ọ bula.


N'ihi na nime Kraist Jisus ọ dighi ike ọ bula obibì-úgwù ma-ọbu ebìghi-úgwù nwere; kama nke nwere ike bu okwukwe nke sitere n'aka ihu-n'anya alusi ọlu ike.


Ya mere nka ka m'nēkwu, kwusi kwa ike nime Onye-nwe-ayi, ka unu ghara ijeghari ọzọ dika ndi mba ọzọ nējeghari kwa, n'ihe-efu nke uche-ha,


Onye anābu ọnu ka ọ bu, bú onye nēmeghi ka okwu nile nke iwu a guzosie ike, ime ha. Ndi Israel nile gāsi kwa, Amen.


O gēru kwa, mb͕e ọtutu ihe ọjọ na ahuhu gāchọta ha, na abù a gāb͕a àmà n'iru ha dika ihe-àmà; n'ihi na agaghi-echezọ ya pua n'ọnu nkpuru-ha: n'ihi na amawom ncheputa-ha nke ndi ahu nēme ta, tutu Mu eme ka ha ba n'ala ahu nke M'ṅuru iyi inye ha.


Ọ gēru kwa, ọ buru na i chezọ Jehova, bú Chineke-gi, we nējeso chi ọzọ, fè ha òfùfè, kpọ kwa isi ala nye ha, ab͕awom àmà megide unu ta na unu aghaghi ila n'iyì.


ka onye ọ bula ghara ighọb͕u na irib͕u nwa-nna-ya n'ihe a: n'ihi na Onye-nwe-ayi bu onye nābọ̀ ọ́bọ̀ bayere ihe ndia nile, dika ayi bu-kwa-ra uzọ gwa unu gwasi kwa unu ike.


Ayi onwe-ayi ahuwo kwa, ayi nāb͕a kwa àmà, na Nna-ayi ezitewo Ọkpara-Ya ka Ọ buru Onye-nzọputa nke uwa.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan