Ma mb͕e ọ bula Onye ahu gābia, bú Mọ nke ezi-okwu, Ọ gēdubà unu n'ezi-okwu nile: n'ihi na Ọ gaghi-ekwu n'Onwe-ya; kama ka ihe Ọ nānu ra, ihe ndia ka Ọ gēkwu: Ọ gākọ-kwa-ra unu ihe nile nke nābia.
Ya mere, umu-nnam, esite-kwa-ra n'aru Kraist me ka unu onwe-unu nwua n'ebe iwu di; ka unu we lakuru di di iche, bú Onye emere ka O si na ndi nwuru anwu bilie, ka ayi we miara Chineke nkpuru.
ebe ọ matara nka, na adighi-enye onye ezi omume iwu, kama anēnye ndi nēmebi iwu, ndi nēkweghi kwa idi n'okpuru iwu, nye ndi nāsọpurughi Chineke, ndi bu kwa ndi-nmehie, nye ndi nādighi ọcha n'obi, ndi emeru-kwa-ra emeru, nye ndi nēb͕u nna-ha na ndi nēb͕u nne-ha, nye ndi nēb͕u madu,