Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Galeshịa 5:17 - Bible Nso

17 N'ihi na agu nāgu anu-aru megide Mọ Nsọ, agu nāgu kwa Mọ Nsọ megide anu-aru; n'ihi na ndia nēmegide onwe-ha; ka unu we ghara ime ihe ndia ọ bula unu nāchọ ime.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

17 Nʼihi na ihe anụ ahụ chọrọ dị iche nʼihe Mmụọ Nsọ chọrọ. Ihe Mmụọ Nsọ chọrọ dịkwa iche nʼihe anụ ahụ chọrọ. Ịgba mgba dị nʼetiti ha na-eme ka ị hapụ inwe ike mee ihe ị chọrọ ime.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Galeshịa 5:17
35 Iomraidhean Croise  

Jehova we si, Mọm agaghi-achi achi nime madu rue mb͕e ebighi-ebi, n'ihi na ya onwe-ya bu kwa anu-aru: ma ubọchi-ya nile gābu ọgu arọ isi.


Me ka nzọ-ukwum nile guzosie ike n'okwu-ọnu-gi: Ekwe-kwa-la ka ajọ ihe ọ bula buru onye-isim.


Le otú m'huworo ihe-iriba-ama-Gi nile n'anya: Dika ebere-Gi si di, Jehova, me ka m'di ndu.


Efughariwom dika aturu nke furu efu; chọ orù-Gi; N'ihi na echezọghm ihe nile I nyere n'iwu.


Nkpuru-obim etiwawo n'ihi ọchichọ O ji chọsie ikpé-Gi nile ike mb͕e nile.


N'uzọ nke ihe nile I nyere n'iwu ka m'gāb͕a ọsọ, N'ihi na I gēme ka obim sa mbara.


Me ka m'zọ ije n'okporo-uzọ nke ihe nile I nyere n'iwu; N'ihi na uzọ ahu nātọm utọ


Le, achọsiwom ihe-iriba-ama-Gi nile ike: N'ezi omume-Gi me ka m'di ndu.


Ọ buru na I riba ajọ omume nile ama, Ja, Onye-nwe-ayi, ònye gēguzo?


Okwu nile nke ajọ omume nile dikaririm ike: Njehie nile ayi, Gi onwe-gi gēkpuchi ha.


N'ezie ọ dighi onye ezi omume n'uwa, nke nēme ezi ihe, nādighi-emehie kwa.


M'we si, Ahuhu nādirim, n'ihi na alawom n'iyì; n'ihi na onye eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua ruru árú ka m'bu, ọ bu kwa n'etiti ndi eb͕ub͕ere-ọnu-ha ruru árú ka m'nēbi: n'ihi na ọ bu Eze-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, ka anyam abua huworo.


Onye nādighi n'akukum nēmegidem; onye nādighi-esokwam ikpokọta ihe nāchusa achusa.


Jisus we za, si ya, Ngọzi nādiri gi, Saimon Bā-Jona: n'ihi na anu-aru na ọbara ekpugheghi ya nye gi, kama ọ bu Nnam Nke bi n'elu-igwe.


Ma O chighariri, si Pita, Ga n'azum, Setan: i bu ihe nēme ka M'ma n'ọnyà: n'ihi na i dighi-atukwasi uche-gi n'ihe Chineke, kama ọ bu n'ihe madu.


Nēchenu nche, nēkpe-kwa-nu ekpere, ka unu we ghara ibà n'ọnwunwa: mọ nke madu di ọku n'ezie, ma anu-aru adighi ike.


Ngọzi nādiri ndi agu ezi omume nāgu, ndi akpiri nākpọ kwa nku na ya: n'ihi na ndi ahu ka afọ gēju.


O we si Ya, Onye-nwe-ayi, abum onye edoziworo iso Gi ga rue ulo-nkpọrọ ru kwa ọnwu.


O we si ha, Gini mere unu nāraru ura? bilienu nēkpe kwa ekpere, ka unu we ghara ibà n'ọnwunwa.


Nke amuworo site n'anu-aru bu anu-aru; nke amuwo-kwa-ra site na Mọ Nsọ bu mọ.


n'ihi na asi na unu nādi ndu dika anu-aru si chọ, unu gaje inwu; ma ọ buru na unu nēwere Mọ Nsọ me ka omume aru nwua, unu gādi ndu.


Ya mere, ìwu ahu nēmegide nkwa Chineke? Chineke ekwela: n'ihi na asi na enyereri iwu nke puru ime ka adi ndu, n'ezie ezi omume gēsitewori n'iwu.


N'ihi na ayi nile nāsu ngọngọ n'ọtutu ihe. Ọ buru na onye ọ bula asughi ngọngọ n'okwu, onye ahu bu nwoke tozuru okè, buru kwa onye puru ikwa aru-ya dum nga.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan