Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Galeshịa 5:16 - Bible Nso

16 Ma asim, Nējegharinu site na Mọ Nsọ, unu agaghi-emezu kwa agu nke anu-aru maọli.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

16 Ana m agwa unu nke a: na-adịnụ ndụ nke Mmụọ Nsọ na-achị, unu anọkwala nʼọchịchọ nke anụ ahụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Galeshịa 5:16
22 Iomraidhean Croise  

Jehova we si, Mọm agaghi-achi achi nime madu rue mb͕e ebighi-ebi, n'ihi na ya onwe-ya bu kwa anu-aru: ma ubọchi-ya nile gābu ọgu arọ isi.


Ya mere, ka nmehie ghara idi nābu eze n'aru-unu nke puru inwu anwu, ime unu ka unu ṅa agu-ya nile nti:


Ya mere ub͕u a ọ dighi amam-ikpe ọ bula diri ndi nọ nime Kraist Jisus.


Ma nka ka m'nēkwu, umu-nnam, emewo ka oge a di nkpunkpu, ka ndi nwere nwunye we di ka ha enweghi site n'ub͕u a;


Ya mere ndi m'huru n'anya, ebe ayi nwere nkwa ndia, ka ayi sachapu n'onwe-ayi nmeru nile nke aru na nke mọ, nēmezu idi-nsọ n'egwu Chineke.


Ma nka bu ihe m'nēkwu; Ọb͕ub͕a-ndu nke Chineke buruworo uzọ dozie nke-ọma, iwu ahu, nke putara mb͕e nnù arọ na orú arọ na iri gasiri, ewezugaghi ọb͕ub͕a-ndu ahu, ime nkwa ahu ka ọ ghara idi irè.


N'ihi na onye nāgha nkpuru nye anu-aru onwe-ya gēsite n'anu-aru ahu weta nmebi dika ihe-ubi; ma onye nāgha nkpuru nye Mọ Nsọ gēsite na Mọ Nsọ weta ndu ebighi-ebi dika ihe-ubi


ndi ayi onwe-ayi nile bi-kwa-ra obi n'etiti ha n'oge gara aga nime agu ihe ọjọ nke anu-aru-ayi, nēme ihe nile anu-aru-ayi na èchìchè-uche-ayi chọrọ, buru kwa umu nke iwe dika esi mu ayi, dika ndi fọduru bu kwa:


ọ bu kwa nime Ya ka ejiri obibì-úgwù anējighi aka me bì unu úgwù, n'iyipuchasi aru nile nke bu anu-aru, n'obibì-úgwù nke Kraist;


dika umu nke iṅa-nti, unu eme-kwa-la onwe-unu ka unu di ka agu ihe ọjọ ahu si di, bú nke guru unu na mbu n'amaghi-ihe-unu:


Ebe unu meworo nkpuru-obi-unu ka ha di ọcha n'iṅa-nti nke unu ṅara ezi-okwu, iwere ihu-n'anya nke iru-abua nādighi ya hu umu-nna-unu n'anya, sitenu n'obi-unu hurita onwe-unu n'anya si-ike:


Ndi m'huru n'anya, ariọm unu dika ndi-ọbìa na ndi nọ dika ọbìa, ka unu ghara ime ihe ọjọ di iche iche nāgu anu-aru, nke bu ihe nēbu agha imegide nkpuru-obi;


N'ihi na ihe eji zìsara ọbuná ndi nwuru anwu ozi ọma bu nka, ka ewe kpe ha ikpé dika esi ekpe madu n'anu-aru, ma ka ha we di ndu dika Chineke si di na mọ.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan