Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Galeshịa 4:30 - Bible Nso

30 Otú ọ di, gini ka ihe edeworo n'akwukwọ nsọ nēkwu? Chupu orù-nwanyi a na nwa-ya nwoke: n'ihi na nwa-nwoke orù-nwanyi agagheso nwa nke nwanyi ahu nke nwere onwe ya keta ihe.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

30 Ma gịnị ka akwụkwọ nsọ kwuru? “Chụpụ ohu nwanyị a na nwa ya, nʼihi na nwa nwoke ohu nwanyị a apụghị isoro nwa nke nwanyị na-abụghị ohu kerikọta oke.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Galeshịa 4:30
11 Iomraidhean Croise  

Ma orù adighi-anọgide n'ulo rue mb͕e ebighi-ebi: nwa nānọgide ebighi-ebi.


Chineke enupughi ndi-Ya nke O buru uzọ mara. Ma-ọbu ùnu amataghi ihe ọ nēkwu, bú ihe edeworo n'akwukwọ nsọ, n'ebe edeworo okwu bayere Elaija? otú ọ nāriọ Chineke aririọ megide Israel, si,


N'ihi na ọ̀ bu gini ka ihe edeworo n'akwukwọ nsọ nēkwu? Abraham we kwere Chineke, ewe gua nke ahu nye ya dika ezi omume.


Otú ọ di, ihe edeworo n'akwukwọ nsọ mechibidoro ihe nile n'okpuru nmehie, ka ewe were nkwa ahu nke sitere n'okwukwe ekwere na Jisus Kraist nye ndi kwere ekwe.


Ma ihe edeworo n'akwukwọ nsọ, ebe o buru uzọ hu na Chineke nēsite n'okwukwe gu ndi mba ọzọ na ndi ezi omume, o buru uzọ zìe Abraham ozi ọma, si, Agāgọzi mba nile nime gi.


N'ihi na edewo ya n'akwukwọ nsọ, na Abraham nwere umu-ndikom abua, otù site n'orù-nwanyi ahu, otù site kwa na nwanyi ahu nke nwere onwe-ya.


N'ihi nka, umu-nnam, ayi abughi umu nke orù-nwanyi, kama ayi bu umu nke nwanyi ahu nwere onwe-ya.


Ma-ọbu ùnu nēchè na ihe edeworo n'akwukwọ nsọ nēkwu okwu n'efu? Àgu ayi nāgusi Mọ ahu ike n'uzọ ekworo, bú Mọ Nke O mere ka O biri nime ayi?


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan