Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Galeshịa 4:12 - Bible Nso

12 Umu-nnam, ariọm unu, menu onwe-unu ka unu di ka mu onwem, n'ihi na mu onwem me-kwa-ra onwem ka m'di ka unu onwe-unu. Unu emeghm ajọ omume ọ bula:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

12 Ezi ụmụnna m, arịọọ m unu, meenụ onwe unu dị ka mụ onwe m, nʼihi na mụ onwe m emela onwe m ka m dị ka unu. O nweghị ihe ọjọọ ọbụla unu mere m.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Galeshịa 4:12
13 Iomraidhean Croise  

ọ bu nání ma asi na unu eme nka ka ayi gēkwere unu: ọ buru na unu gādi ka ayi, ka ebìe nwoke ọ bula n'etiti unu úgwù;


Ọ si Jehoshafat, Ì gēsorom je agha na Remot-gilead? Jehoshafat we si eze Israel, Dika m'di, otú a ka i di; dika ndim di, otú a ka ndi-gi di; dika inyinyam di, otú a ka inyinya-gi di.


eji-kwa-ra okwu-ọnu zí ha ihe bayere gi, na i nēzí ndi-Ju nile ndi nọ n'etiti ndi mba ọzọ irapu Moses, ebe i nāgwa ha ka ha ghara ibì umu-ha úgwù, ka ha ghara kwa ijeso ọme-n'ala nile nke iwu-ayi.


Ma ọ buru na onye ọ bula emewo ka o wuta ayi, ọ bughi mu onwem, kama, n'otù akuku (ka m'ghara idọb͕u unu nke-uku) ọ bu unu nile ka o meworo ka o wuta.


Ndi Kọrint, ọnu-ayi ghere oghe igwawa unu okwu, emewo ka obi-ayi di obodobo.


Ma dika ugwọ-ọlu n'otù uzọ ahu (anamekwu dika anāgwa umum), ka eme kwa ka unu onwe-unu di obodobo n'obi-unu.


Ma mb͕e m'huru na ha agazighi dika ezi-okwu nke ozi ọma si di, asirim Kifas n'iru ha nile, Ọ buru na gi onwe-gi adi ndu dika ndi mba ọzọ, ma ọ bughi dika ndi-Ju, ọ bu ezie na i bu onye-Ju, ì si aṅa erugide ndi mba ọzọ ka ha so uzọ ndi-Ju?


Anamatu egwu unu, ma o nwere uzọ ọ bula m'dọb͕uworo onwem n'ọlu n'aru unu n'efu.


ma unu matara na ọ bu n'ihi adighi-ike nke anu-aru ka m'zìri unu ozi ọma na mbu:


Ma Chineke ekwela ka m'nya isi, ma-ọbughi n'obe Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, nke esiteworo na ya kpọgide uwa n'ebe m'nọ, kpọgide kwa mu onwem n'ebe uwa di.


Ka amara nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist diyere mọ-unu, umu-nnam. Amen.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan