Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Galeshịa 3:8 - Bible Nso

8 Ma ihe edeworo n'akwukwọ nsọ, ebe o buru uzọ hu na Chineke nēsite n'okwukwe gu ndi mba ọzọ na ndi ezi omume, o buru uzọ zìe Abraham ozi ọma, si, Agāgọzi mba nile nime gi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

8 Dị ka ọ dị nʼAkwụkwọ nsọ, nʼoge ahụ dị nʼihu, nke bụ ugbu a, Chineke ga-agụ ndị mba ọzọ dị ka ndị ezi omume, site nʼokwukwe ha nwere nʼime ya. Nʼihi nke a, o buru ụzọ zie Ebraham oziọma ahụ nʼoge gara aga sị, “A ga-agọzikwa agbụrụ niile nọ nʼụwa site na gị.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Galeshịa 3:8
25 Iomraidhean Croise  

M'gāgọzi kwa ndi nāgọzi gi, ọ bu kwa onye nākọcha gi ka M'gābu ọnu: agāgọzi kwa ab͕uru nile nke uwa nime gi.


ebe Abraham nāghaghi ighọ mba di uku nwe kwa ume, agāgọzi kwa mba nile nke uwa nime ya?


ọ bu kwa na nkpuru-gi ka mba nile nke uwa gāgọzi onwe-ha; n'ihi na i gewo nti n'olum.


M'gēme kwa ka nkpuru-gi ba uba dika kpakpando nke elu-igwe, M'gēnye kwa nkpuru-gi ala ndia nile; ọ bu kwa na nkpuru-gi ka mba nile nke uwa gāgọzi onwe-ha;


nkpuru-gi gādi kwa ka ájá ala, i gāb͕asa n'uzọ Ọdida anyanwu na n'uzọ Iru-anyanwu na n'uzọ Ugwu na n'uzọ Ndida: agāgọzi kwa ab͕uru nile nke elu-uwa nime gi na nime nkpuru-gi.


Nkpa-n'aka eze agaghi-esi n'ebe Juda nọ wezuga onwe-ya, Nkpa-n'aka onye nēnye ukpuru agaghi-esi kwa n'etiti ukwu-ya abua wezuga onwe-ya, Rue mb͕e Shailo gābia; Ọ bu kwa ya gēnwe iṅa-nti ndi di iche iche.


Onye ezi omume gāma akwukwọ n'ubọchi nile ya dika osisi ndu; Ọtutu udo gādi kwa rue mb͕e ọnwa agaghi-adi.


Ma ọ buru na otù uzọ n'uzọ iri afọdu nime ya, aghaghi irechapu kwa ya ọzọ: dika osisi terebinth, na dika osisi oak, nke ogwe fọduru ha mb͕e eb͕utusiri ha; nkpuru nsọ bu ogwe-ya.


M'gēme kwa otù nkpuru ka o si na Jekob puta, na otù onye-nnweta nke ugwum nile ka o si na Juda puta: ndi M'rọputaworo ewe nweta ya, ndi-orùm gēbi kwa n'ebe ahu.


i gāṅu kwa iyi, Jehova nādi ndu, n'ezi-okwu, na n'ikpé ziri ezi, na n'ezi omume; mba nile gāgọzi kwa onwe-ha nime Ya, ọ bu kwa nime Ya ka ha gānya isi.


Ọzọ kwa, ihe ọzọ di iche edeworo n'akwukwọ nsọ si, Ha gēlegide Onye ahu Nke ha mapúru amapú.


Onye nēkwere na Mu, dika ihe edeworo n'akwukwọ nsọ kwuru, n'afọ-ya ka osimiri nke miri di ndu gēsi nērùputa.


Àkwukwọ nsọ ekwughi na Kraist-ayi nēsi na nkpuru Devid bia, site kwa na Betlehem, bú obodo ntá ebe Devid nọri?


Rue mb͕e M'gēdo ndi-iro-Gi ka ihe-nb͕akwasi nke ukwu-Gi abua.


N'ihi na ihe edeworo n'akwukwọ nsọ nāsi Fero, Ọ bu n'ihi otù ihe a ka M'mere ka i bilie, ka M'we gosi ikem nime gi, ka ewe kwusa kwa aham n'uwa nile.


Gini ka ayi gēkwu kwa? Na ndi mba ọzọ, ọ bu ezie na ha ab͕asoghi ezi omume, ma ha ruru ezi omume, ma ọ bu ezi omume ahu nke si n'okwukwe puta:


Ma ọ bu Abraham ka ekwere nkwa ndia, ya na Nkpuru-ya. Ọ sighi, Na nkpuru, dika Ọ nēkwu okwu bayere ọtutu; kama dika Ọ nēkwu okwu bayere otù Onye, Ọ si, Na Nkpuru-gi, Nke bu Kraist.


Otú ọ di, ihe edeworo n'akwukwọ nsọ mechibidoro ihe nile n'okpuru nmehie, ka ewe were nkwa ahu nke sitere n'okwukwe ekwere na Jisus Kraist nye ndi kwere ekwe.


Otú ọ di, gini ka ihe edeworo n'akwukwọ nsọ nēkwu? Chupu orù-nwanyi a na nwa-ya nwoke: n'ihi na nwa-nwoke orù-nwanyi agagheso nwa nke nwanyi ahu nke nwere onwe ya keta ihe.


N'ihi na eziwo kwa ayi ozi ọma, ọbuná dika ezi-kwa-ra ha: ma okwu nke ha nuru abaraghi ha urù, n'ihi na ejighi okwukwe tunyere ha na ndi nuru n'ezie.


Mọ-ozi nke-asa we fùa opì; oké olu we da n'elu-igwe, ha we si, Ala-eze nke uwa aghọwo ala-eze nke Onye-nwe-ayi, na nke Kraist-Ya: Ọ gābu kwa eze rue mb͕e nile ebighi-ebi.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan