Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Galeshịa 3:5 - Bible Nso

5 Ya mere Onye ahu Nke nwe inyezu unu Mọ Nsọ, Nke nāluputa kwa ọlu di ike nime unu, Ò sitere n'ọlu di iche iche nke iwu ma-ọbu na o sitere n'ọnunu nke okwukwe nēme ya?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

5 Mmụọ nsọ ahụ Chineke nyere unu na ọrụ ebube ọ rụrụ nʼetiti unu, o mere ha nʼihi iwu unu debere, ka ọ bụ nʼihi na unu nụrụ ma kwerekwa oziọma?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Galeshịa 3:5
14 Iomraidhean Croise  

Ya mere ha nọgidere n'ebe ahu oge di anya, nēkwuwa okwu nime Onye-nwe-ayi, Onye nāb͕ara okwu amara-Ya àmà, ebe Ọ nēnye ka eme ihe-iriba-ama na ọlu-ebube di iche iche site n'aka-ha.


Ya mere, okwukwe si n'ọnunu puta, ma ọnunu ahu sitere n'okwu Kraist.


n'ike nke ihe-iriba-ama na ọlu-ebube di iche iche, n'ike nke Mọ Nsọ; ya mere site na Jerusalem, na ala nke di ya gburugburu rue Ilirikọm, ezìzuwom ozi ọma Kraist;


nye kwa onye ọzọ nluputa nke ọlu di ike; nye kwa onye ọzọ obubu-amuma; nye kwa onye ọzọ itule mọ di iche iche; nye kwa ibe-ya aha asusu di iche iche; nye kwa onye ọzọ isughari asusu:


(n'ihi na ihe-agha nke ibu-agha-ayi abughi nke anu-aru, kama ha sitere na Chineke bu ihe puru ikwada ebe ewusiri ike);


Ewere ihe-iriba-ama di iche iche na ọlu-ebube na ọlu di ike di iche iche luputa ihe-iriba-ama nile nke onye-ozi n'etiti unu ezie na ntachi-obi nile.


ebe unu nāchọ ihe inwaputa Kraist Onye nēkwu okwu nimem; Onye nābughi onye nādighi ike n'ebe unu nọ, kama Ọ di ike nime unu:


ìje-ozi nke Mọ Nsọ gēsi aṅa ghara idi kari n'ebube?


Ma Onye ahu Nke nwere inyezu onye nāgha nkpuru nkpuru-ya, Onye nwe-kwa-ra inyezu madu nri ka o rie, Onye ahu gēnyezu unu nkpuru-ọghigha-unu, me kwa ka ha ba uba, Ọ gēme kwa ka nkpuru ezi omume-unu rie nne kari:


Náni nka ka m'nāchọ imata n'ọnu-unu, Ùnu sitere n'ọlu di iche iche nke iwu nata Mọ Nsọ, ma-ọbu na unu sitere n'ọnunu nke okwukwe nata Ya?


N'ihi na amataram na nka gēme ka m'nwe nzọputa, site n'aririọ-unu na nnyezu nke Mọ nke Jisus Kraist,


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan