Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Galeshịa 3:27 - Bible Nso

27 N'ihi na ka unu ra, bú ndi emere baptism ibà nime Kraist, unu yikwasiri Kraist.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

27 Nʼihi na ka unu niile ha, bụ ndị e mere baptizim nʼime Kraịst, abụrụla ndị yikwasịrị onwe ha Kraịst.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Galeshịa 3:27
20 Iomraidhean Croise  

Ezi omume ka m'yiri dika uwe, o we werem yikwasi onwe-ya: Ezi ikpém di ka uwe-nwuda na ákwà-ike-n'isi.


Obi gātọm utọ nke-uku nime Jehova, nkpuru-obim gēteghari egwú ọṅù nime Chinekem; n'ihi na Ọ chiriwo uwe nzọputa yikwasim, O werewo uwe-nwuda ezi omume kpuchiem, dika onye nālu nwunye ọhu si ewere ihe ọma ike n'isi ke onwe-ya dika onye-nchu-àjà, na dika nwanyi anālu ọhu si ewere ihe-ejiji-ya nile chọ onwe-ya nma.


Ma nna-ya siri ndi-orù-ya, Chiputa uwe-nwuda nke kachasi nma ọsọsọ, were ya yikwasi ya; tiye kwa nb͕a-aka n'aka-ya, na akpukpọ-ukwu n'ukwu-ya:


Mb͕e emere ya na èzí-na-ulo-ya baptism, ọ riọ ayi, si, Ọ buru na unu atulewo na abum onye kwere n'Onye-nwe-ayi, batanu n'ulom, nọgide n'ebe ahu. O we rugide ayi.


Pita we si ha, Chègharianu, ka eme kwa unu nile baptism n'otù n'otù n'aha Jisus Kraist, ka ewe b͕aghara nmehie nile unu; unu gānata kwa onyinye a, bú Mọ Nsọ.


n'ihi na ọ kādakwasighi n'isi onye ọ bula n'etiti ha: ọ bu nání na emere ha-ri baptism ibà n'aha Onye-nwe-ayi Jisus.


Ngwa ngwa ihe dika akpirikpa we si n'anya-ya dapu, eme-kwa-ra ka ọ hu uzọ; o we bilie, eme ya baptism;


Kama yikwasinu Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, unu ebu-kwa-la uzọ nēchère aru, ime ihe ọjọ nāgu ya.


ma ọ bu ezi omume Chineke, site n'okwukwe ekwere na Jisus Kraist, nke diri ndi nile kwere: n'ihi na ọ dighi ihe di iche;


eme-kwa-ra ha nile baptism ibà nime Moses nime igwe-oji ahu na nime oké osimiri ahu;


N'ihi na nime otù Mọ Nsọ ka emere ayi onwe-ayi nile baptism ibà n'otù aru, ma ayi bu ndi-Ju ma-ọbu ndi-Grik, ma ayi bu ndi-orù ma-ọbu ndi nwere onwe-ha; eme-kwa-ra ka ayi nile ṅua nime otù Mọ Nsọ.


ka unu yikwasi kwa madu ọhu unu, nke ekère dika Chineke chọrọ nime ezi omume na idi-ọcha nke ezi-okwu ahu.


yikwasi kwa madu ọhu ahu, nke anēme ya ka ọ di ọhu rue na nmazu dika onyinyo nke Onye kère ya si di:


bú miri nke nāzọputa kwa unu ub͕u a n'uzọ yiri ihe-atù a, ya bu baptism, ọ bughi itupu inyi nke aru, kama ọ bu ajuju nke ezi akọ-na-uche n'ebe Chineke nọ, site na nbilite-n'ọnwu nke Jisus Kraist;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan