Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Galeshịa 3:21 - Bible Nso

21 Ya mere, ìwu ahu nēmegide nkwa Chineke? Chineke ekwela: n'ihi na asi na enyereri iwu nke puru ime ka adi ndu, n'ezie ezi omume gēsitewori n'iwu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

21 Iwu ahụ ọ na-emegide nkwa nke Chineke? Mba. Nʼezie ọ dịghị. Nʼihi na a sị na e nwere iwu dị nke pụrụ inye mmadụ ndụ, mgbe ahụ, ezi omume gaara abịara mmadụ site nʼiwu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Galeshịa 3:21
18 Iomraidhean Croise  

Ọ gābia, la ndi-ọlu-ubi ahu n'iyì, were kwa ubi-vine ahu nye ndi ọzọ. Ma mb͕e ha nuru ya, ha si, Chineke ekwela.


Àyi nēsite kwa n'okwukwe-ayi me ka iwu ghara idi irè? Chineke ekwela: kama ayi nēme ka iwu guzo.


Chineke ekwela: kama ka ọ puta ihè na Chineke bu Onye ezi-okwu, ma madu nile n'otù n'otù bu ndi-ugha; dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ, si, Ka ewe gua Gi n'onye ezi omume n'okwu-Gi nile, Ka I we kpeb͕u kwa mb͕e anēkpe Gi ikpé.


Chineke ekwela: n'ihi na Chineke gēsi kwa aṅa kpe uwa ikpé?


ma Israel, ọ bu ezie na ha nāb͕aso iwu ezi omume, ma ha ekwudoghi iwu ahu.


Ma ọ buru na ije-ozi nke ọnwu, nke edeworo n'akwukwọ, nke atuworo n'elu nkume, biara n'ebube, nke mere umu Israel apughi ilegide iru Moses anya n'ihi ebube nke iru-ya; ebube nke anēme ka ọ ghara idi irè:


Ma ọ buru na ahuru na ayi onwe-ayi bu kwa ndi-nmehie, mb͕e ayi nāchọ uzọ agēsi gu ayi na ndi ezi omume nime Kraist, ọ̀ bu na Kraist bu onye nēje ozi nmehie? Chineke ekwela.


N'ihi, na mu onwem sitere n'aka iwu nwua n'ebe iwu di, ka m'we di ndu n'ebe Chineke nọ


Ajughm amara nke Chineke: n'ihi na asi na ezi omume abia site n'aka iwu, ya mere Kraist nwuru n'efu.


Ma Chineke ekwela ka m'nya isi, ma-ọbughi n'obe Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, nke esiteworo na ya kpọgide uwa n'ebe m'nọ, kpọgide kwa mu onwem n'ebe uwa di.


Noa, mb͕e Chineke dusiri ya ọdu bayere ihe akāhughi anya rue oge ahu, ebe ọ turu egwu Chineke, ọ bu okwukwe ka o ji dozie ub͕ọ izọputa èzí-na-ulo-Ya; o site-kwa-ra na nka ma uwa ikpé, we ghọ onye-nketa nke ezi omume ahu nke di n'uzọ okwukwe.


N'ihi na emere ka ihe eburu uzọ nye n'iwu ghara idi irè n'ihi adighi-ike-ya na abaghi-urù-ya,


(n'ihi na iwu ahu emeghi ihe ọ bula ka o zue okè), ewe webata olile-anya ka nma, nke ayi ji biaru Chineke nso.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan