Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Galeshịa 2:6 - Bible Nso

6 Ma site n'ọnu ndi akpọrọ ihe (aha madu ha buri n'oge gara aga, o meghi ihe di iche n'anyam: Chineke adighi-ele madu anya n'iru) asim, na ndi ahu akpọrọ ihe enyeghm ìzù ọ bula:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

6 Banyere ndị a na-ewe ka ndị dị ndu dị mkpa, ihe ọbụla ọnọdụ ha bụ ewetaghị mgbanwe ọbụla nʼebe m nọ, nʼihi na Chineke adịghị ele mmadụ anya nʼihu. Ndị ahụ atụkwasịghị ihe ọbụla nʼoziọma m na-ezisa.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Galeshịa 2:6
22 Iomraidhean Croise  

Àgāsi kwa Ya otú a, bú Onye nādighi-ahu ndi-isi iru-ọma, Nke nādighi-amata kwa ọgaranya kari onye nēnweghi ike? N'ihi na ọlu nke aka-Ya ka ha nile bu.


Ha we zigara Ya ndi nēso uzọ-ha, ha na ndi Herod, si, Onye-ozizí, ayi amatawo na I bu onye ezi-okwu, na I nēzí kwa uzọ Chineke n'ezi-okwu, na I dighi-asọ kwa onye ọ bula anya: n'ihi na I dighi-ele madu anya n'iru.


Ha we bia, si Ya, Onye-ozizí, ayi amatawo na I bu onye ezi-okwu, na I dighi-asọ kwa onye ọ bula anya: n'ihi na I dighi-ele madu anya n'iru, kama I nēzi uzọ Chineke n'ezi-okwu: ò ziri ezi n'iwu itu ùtú nye Sisa, ma-ọbu na ò zighi ezi?


Ha we jua Ya, si, Onye-ozizí, ayi amatawo na I nēkwu nēzi kwa ihe ziri ezi, na I dighi-ele kwa madu anya n'iru, kama I nēzí uzọ Chineke n'ezi-okwu:


Pita we saghe ọnu-ya, si, N'ezie anamaghọta na Chineke abughi onye nēle madu anya n'iru:


N'ihi na mb͕e ubọchi nda akērughi Teudas biliri, nākpọ onwe-ya ihe; onye ọnu-ọgugu ndikom, ra ka nnù madu, dayere ya: onye eb͕uru; ndi nile, ka ha ra, bú ndi kweyere ya, we b͕asa, ha we ghọ ihe-efu.


n'ihi na ile-madu-anya-n'iru adighi n'ebe Chineke nọ.


N'ihi na anamagu na ọ dighi uzọ ọ bula m'nērughi ndi kachasi elu n'etiti ndi-ozi.


Aghọwom onye nēnweghi uche: unu onwe-unu rugiderem; n'ihi na ugwọ unu ji mu onwem bu ime ka amaram: n'ihi na ọ dighi uzọ ọ bula m'nērughi ndi kachasi elu n'etiti ndi-ozi, asi na ọ bu ezie na abughi m ihe ọ bula.


Ya mere ayi onwe-ayi amataghi onye ọ bula site n'ub͕u a dika anu-aru nāmata: ọbuná asi na ayi amawo Kraist dika anu-aru mara, ma ub͕u a ayi amaghi Ya ọzọ otú a.


Ma arigorom n'uzọ nkpughe; m'we debe n'iru ha ozi ọma ahu nke m'nēkwusa n'etiti ndi mba ọzọ, ma edeberem ya n'iru ndi akpọrọ ihe mb͕e ha nọ iche, ka m'ghara ibu onye nāb͕a ọsọ ma-ọbu onye b͕arari ọsọ n'efu n'uzọ ọ bula.


N'ihi na asi na madu nēchè na ya bu ihe, mb͕e ọ nābughi ihe ọ bula, ọ nāghọ onwe-ya aghughọ n'obi.


N'ihi na Jehova, bú Chineke-unu, Ya onwe-ya bu Chineke kachasi chi nile, na Onye-nwenu kachasi ndi-nwenu nile, Chineke uku ahu, bú dike, di kwa egwu, Onye nāhughi madu iru-ọma n'ikpé, Onye nānaraghi ihe-iri-ngo.


Nēkweyenu ndi-isi-unu, nēdo-kwa-nu onwe-unu n'okpuru ha: n'ihi na ndi ahu nāmu anya n'ihi nkpuru-obi-unu, dika ndi gāza ajuju bayere unu: ka ha we were ọṅù me nka, ghara isu udè: n'ihi na nka gābu ihe nābaghi unu urù.


Nēchetanu ndi-isi-unu, bú madu ndi gwara unu okwu Chineke; nēkiri-kwa-nu ọpupu nke ibi-obi-ha, nēṅomi-kwa-nu okwukwe-ha.


Ọ buru kwa na unu akpọku Ya dika Nna, bú Onye nēkpe ikpé dika ọlu madu nile n'otù n'otù si di nēleghi madu anya n'iru, nēbinu obi n'egwu n'oge unu bi dika ọbìa:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan