Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Galeshịa 2:5 - Bible Nso

5 ndi ayi nēnyeghi uzọ n'uzọ ido onwe-ayi n'okpuru ha, é-è, ọ bughi otù oge hour; ka ezi-okwu nke ozi ọma we nọgide n'etiti unu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

5 Ma o nweghị oge anyị ji gee ntị nʼihe ha kwuru, nʼihi na anyị chọrọ ichedo eziokwu ahụ dị nʼoziọma ka a ghara ịgwa ya ihe ọbụla nʼetiti unu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Galeshịa 2:5
11 Iomraidhean Croise  

Ha we ziterem ozi ub͕ò anọ dika okwu a si di; m'we zaghachi ha okwu dika okwu a si di.


Ma mb͕e nkewa na ajuju nādighi ntà diri Pọl na Banabas imegide ha, ndi Kraist we dozie ka Pọl na Banabas, na ufọdu ndi ọzọ n'etiti ha, rigoro Jerusalem jekuru ndi-ozi na ndi-okenye bayere ajuju a.


Ọ nējum anya na unu nēsi n'aka Onye kpọrọ unu n'amara Kraist b͕abiga ọsọsọ otú a n'ozi ọma di iche;


Ma mb͕e m'huru na ha agazighi dika ezi-okwu nke ozi ọma si di, asirim Kifas n'iru ha nile, Ọ buru na gi onwe-gi adi ndu dika ndi mba ọzọ, ma ọ bughi dika ndi-Ju, ọ bu ezie na i bu onye-Ju, ì si aṅa erugide ndi mba ọzọ ka ha so uzọ ndi-Ju?


Ya mere àghọwom onye-iro-unu, n'ihi na anamagwa unu ezi-okwu?


Onye unu onwe-unu nọ kwa nime Ya, mb͕e unu nuru okwu nke ezi-okwu ahu, bú ozi ọma nke nzọputa-unu, ọ bu kwa nime Ya, mb͕e unu kwekwa-ra na Ya, ka eji Mọ Nsọ nke nkwa ahu ka unu akàrà,


n'ihi olile-anya ahu nke edebeworo unu n'elu-igwe, nke unu nuru ihe bayere ya na mbu n'okwu nke ezi-okwu nke ozi ọma,


Ọ bu kwa n'ihi nka ka ayi onwe-ayi nēkele kwa Chineke nēwepughi aka, na, mb͕e unu natara okwu nke unu nuru n'ọnu-ayi, bú okwu nke Chineke, ọ bughi okwu madu ka unu nara nke-ọma, kama, otú ọ di n'ezi-okwu, ọ bu okwu Chineke, nke nālusi kwa ọlu ike nime unu ndi kwere ekwe.


Ndi m'huru n'anya, ebe m'nānu ọku nile n'obi idegara unu akwukwọ bayere nzọputa ahu azọputakọrọ ayi, ọ dim nkpà idegara unu akwukwọ nāriọ unu ka unu nāb͕asi nb͕a ike n'ihi okwukwe ahu nke enyere ndi nsọ n'aka nání otù mb͕e idebe.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan