Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Galeshịa 2:21 - Bible Nso

21 Ajughm amara nke Chineke: n'ihi na asi na ezi omume abia site n'aka iwu, ya mere Kraist nwuru n'efu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

21 Anaghị m akpọ amara Chineke ihe na-enweghị isi. Nʼihi na a sị na a pụrụ ịgụ mmadụ dị ka onye ezi omume site nʼidebe iwu, mgbe ahụ ọnwụ Kraịst nwụrụ abaghị uru.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Galeshịa 2:21
16 Iomraidhean Croise  

Jehova emebiwo ndum-ọdu mba nile: Ọ siwo èchìchè nile nke ndi di iche iche, É-è.


Ma mu onwem siri, N'efu ka m'dọb͕uworo onwem n'ọlu, n'ihi ihe tọb͕ọrọ n'efu na otù nku-ume ka m'meworo ka ikem gwusia: n'ezie ikpém di n'aka Jehova, ugwọ-ọlum di kwa n'aka Chinekem.


Ùnu si aṅa si, Ndi mara ihe ka ayi bu, iwu Jehova di kwa n'aka ayi? Ma otú o di, le, okwu-ugha ka pen ugha nke ndi-ode-akwukwọ meworo ya.


O we si ha, Unu nāju ihe Chineke nyere n'iwu nke-ọma, ka unu we debe ozizí nke enyere n'aka-unu idebe.


N'ihi na, ebe ha nāmaghi ezi omume Chineke, nāchọ kwa uzọ ime ka ezi omume nke aka ha guzo, ha edoghi onwe-ha n'okpuru ezi omume Chineke.


Ma ọ buru na ọ di n'amara, o siteghi kwa ọzọ n'ọlu: ebe ahuru na amara abughi amara ọzọ, ma asi na ọ dighi otú a.


Onye arara Ya nye n'ihi ndahie-ayi nile, ewe me ka O si n'ọnwu bilie n'ihi igu ayi na ndi ezi omume.


Gini kwa ka ayi gēkwu n'ile ihe ndia anya? Ọ buru na Chineke diri ayi, ònye nēmegide ayi?


ma ọ buru na emeghi ka Kraist si n'ọnwu bilie, ya mere ihe ayi nēkwusa bu ihe-efu, okwukwe-unu bu kwa ihe-efu.


ma ọ buru na emeghi ka Kraist si n'ọnwu bilie, okwukwe-unu bu ihe-efu; unu nānọ na nmehie nile unu ub͕u a.


nke esite-kwa-ra zọputa unu, ma ọ buru na unu jidesie ya ike, bú aha okwu m'ji zì unu ozi ọma ahu, ma asi na ọ bughi na unu kwere n'efu.


ma ebe ayi matara na agughi madu n'onye ezi omume site n'ọlu di iche iche nke iwu, ma ọ bu nání okwukwe ekwere na Jisus Kraist ka eji gu madu n'onye ezi omume, ọbuná ayi onwe-ayi kwere na Kraist Jisus, ka ewe gua ayi na ndi ezi omume site n'okwukwe ayi kwere na Kraist, ọ bughi kwa site n'ọlu di iche iche nke iwu: n'ihi na site n'ọlu di iche iche nke iwu ọ dighi anu-aru ọ bula, bú madu, agāgu n'onye ezi omume.


N'ihi na asi na ihe m'kwaturu, ihe ndia ka m'nēwuli elu ọzọ dika ulo, anameme ka madu mara na abum onye-njehie.


Ya mere, ìwu ahu nēmegide nkwa Chineke? Chineke ekwela: n'ihi na asi na enyereri iwu nke puru ime ka adi ndu, n'ezie ezi omume gēsitewori n'iwu.


Ya mere ọ buru na ewere ọnọdu ndi-nchu-àjà ndi Livai me ka madu zue okè (n'ihi na ndi Israel anatawo iwu n'okpuru ya), nkpà gini ọzọ di ka onye-nchu-àjà di iche bilie dika usoro Melkizedek si di, ka aghara kwa igu ya dika usoro Eron si di?


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan