Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Galeshịa 2:19 - Bible Nso

19 N'ihi, na mu onwem sitere n'aka iwu nwua n'ebe iwu di, ka m'we di ndu n'ebe Chineke nọ

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

19 Nʼihi na-esitere m nʼaka iwu nwụọ nʼebe iwu dị, ka m nwee ike dị ndụ nʼebe Chineke nọ. Akpọgidela mụ na Kraịst nʼobe.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Galeshịa 2:19
28 Iomraidhean Croise  

n'ihi na iwu ahu nāluta iwe; ma ebe iwu nādighi, njehie adighi kwa.


Iwu we b͕ebà, ka ndahie ahu we rie nne; ma n'ebe nmehie riri nne, n'ebe ahu ka amara babigara ókè nke-uku kari:


Otú a unu onwe-unu, nāgu-kwa-nu na unu onwe-unu bu ndi nwuru anwu n'ebe nmehie di, ma na unu nādi ndu nime Kraist Jisus n'ebe Chineke nọ.


N'ihi na nmehie agaghi-abu onye-nwe-unu: n'ihi na unu anọghi n'okpuru iwu, kama n'okpuru amara.


Chineke ekwela. Ayi onwe-ayi, bú ndi nwuru n'ebe nmehie di, àyi gēsi aṅa nādi ndu ọzọ nime ya?


N'ihi na ayi matara na iwu ahu bu ihe nke Mọ: ma mu onwem bu ihe nke anu-aru, erewokwam inọ n'okpuru nmehie.


Ya mere, umu-nnam, esite-kwa-ra n'aru Kraist me ka unu onwe-unu nwua n'ebe iwu di; ka unu we lakuru di di iche, bú Onye emere ka O si na ndi nwuru anwu bilie, ka ayi we miara Chineke nkpuru.


N'ihi na iwu nke Mọ nke ndu nime Kraist Jisus mere ka m'pua n'aka iwu nke nmehie na nke ọnwu, nwere onwem.


Ya mere ma unu nēri ihe, ma unu nāṅu ihe, ma unu nēme ihe ọ bula, nēmenu ihe nile ka ewe nye Chineke otuto.


N'ebe ndi-Ju nọ m'we di ka onye-Ju, ka m'we rita ndi-Ju n'urù; n'ebe ndi nọ n'okpuru iwu di m'we di ka onye nọ n'okpuru iwu, ọ bughi na mu onwem nọ n'okpuru iwu, ka m'we rita ndi nọ n'okpuru iwu n'urù;


Ọ nwu-kwa-ra n'ọnọdu madu nile, ka ndi di ndu we ghara idiri onwe-ha ndu ọzọ, kama ka ha diri Onye ahu ndu, bú Onye nwuru n'ọnọdu ha, eme kwa ka O si n'ọnwu bilie.


Akpọgidekọwo mu na Kraist n'obe; ọ bughi kwa mu onwem nādi ndu ọzọ, kama ọ bu Kraist nādi ndu nimem ma ndu ahu m'nādi n'anu-aru ub͕u a, anamadi ya n'okwukwe, bú nke m'kwere n'Ọkpara Chineke, Onye hurum n'anya, rara kwa Onwe-ya nye n'ihim.


N'ihi na ka ha ra, bú ndi sitere n'ọlu nke iwu, ha nọ n'okpuru ọbubu-ọnu: n'ihi na edewo ya n'akwukwọ nsọ, si, Onye anābu ọnu ka ọ bu, bu onye ọ bula nke nānọgideghi n'ihe nile edeworo n'akwukwọ iwu, ime ha.


Ya mere iwu ahu aghọwo onye-ozìzí-ayi ikpọrọ ayi biakute Kraist, ka ewe site n'okwukwe gua ayi na ndi ezi omume.


Ma Chineke ekwela ka m'nya isi, ma-ọbughi n'obe Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, nke esiteworo na ya kpọgide uwa n'ebe m'nọ, kpọgide kwa mu onwem n'ebe uwa di.


Ọ buru na unu na Kraist nwukọrọ anwu pua n'ihe-ozizí mbu nke uwa, gini mere, dika agāsi na unu nādi ndu n'uwa, unu nēdo onwe-unu n'okpuru iwu di iche iche enyere,


N'ihi na unu nwuru anwu, ezowo kwa ndu-unu n'ebe Kraist-ayi nọ nime Chineke.


Onye nwuru n'ihi ayi, ka ọ gābu, ma ayi nēche nche ma ayi nāraru ura, ka ayi we so Ya dikọ ndu.


Onye nyere Onwe-ya n'ihi ayi, ka O we b͕aputa ayi n'imebi-iwu nile, sachakwara Onwe-ya otù ndi nke gābu ndi nke aka Ya, ndi obi-ha nānuru ọlu ọma ọku.


ọ̀bara Kraist, Onye sitere n'aka Mọ ebighi-ebi che Onwe-ya nātaghi uta n'iru Chineke, gēsi aṅa ghara ime akọ-na-uche-ayi ka ọ di kari ọcha nke-uku ri nne pua n'ọlu nile nwuru anwu ikpere Chineke di ndu?


Onye Ya onwe-ya, dika àjà achuru, būru nmehie nile ayi n'aru-Ya n'elu osisi ahu, ka ayi, ebe ayi nwuworo n'ebe nmehie nile di, ka ayi we di ndu n'ebe ezi omume di; Onye eji ọnyá-utari-Ya me ka unu nwe ezi ndu.


N'ihi na ihe eji zìsara ọbuná ndi nwuru anwu ozi ọma bu nka, ka ewe kpe ha ikpé dika esi ekpe madu n'anu-aru, ma ka ha we di ndu dika Chineke si di na mọ.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan