Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Galeshịa 1:5 - Bible Nso

5 Onye otuto diri rue mb͕e nile ebighi-ebi. Amen.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

5 Onye otuto dịịrị ruo mgbe niile ebighị ebi. Amen.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Galeshịa 1:5
23 Iomraidhean Croise  

Ma ub͕u a, Chineke-ayi, ayi onwe-ayi nēkele Gi, nēto kwa aha-Gi mara nma.


Onye agọziri agọzi ka Jehova, bú Chineke Israel, bu, Site na mb͕e ebighi-ebi we rue mb͕e ebighi-ebi. Amen, na Amen.


Ihe agọziri agọzi ka aha nsọpuru Ya bu kwa rue mb͕e ebighi-ebi; Ka uwa nile juputa kwa na nsọpuru-Ya. Amen, na Amen.


N'ihi nka sọpurunu Jehova n'ala ìhè nile, sọpurunu aha Jehova, bú Chineke Israel, n'ala nile nke di oké osimiri buruburu.


Ka ha nye Jehova nsọpuru, gosi kwa otuto-Ya n'agwe-etiti nile.


nēzí ha ka ha debe ihe nile, ka ha ra, bú nke M'nyere unu n'iwu: ma le, Mu onwem nọyere unu ubọchi nile, rue ọgwugwu oge a.


Ewebàla ayi nime ọnwunwa, kama dọputa ayi n'aka ajọ onye ahu.


Otuto diri Chineke n'ebe kachasi ihe nile elu, Udo di kwa n'elu uwa n'etiti madu ndi ihe-ha di Ya ezi nma.


N'ihi na ihe nile sitere nime Ya, site kwa n'aka-Ya, di-kwa-ra Ya. Ọ bu Ya ka otuto diri rue mb͕e nile ebighi-ebi. Amen.


Chineke Nke nání Ya bu Onye-amam-ihe, site n'aka Jisus Kraist, Onye otuto diri rue mb͕e nile ebighi-ebi. Amen.


N'ihi nka, ma ọ buru na ihe-oriri eme ka nwa-nnam ma n'ọnyà, m'gaghi-eri anu ma-ọli rue mb͕e ebighi-ebi, ka m'ghara ime ka nwa-nnam ma n'ọnyà.


ka ayi we buru ihe agēji to ebube-Ya, ayi ndi leworo anya Kraist na mbu:


Ma otuto diri Chineke-ayi, bú Nna-ayi, rue mb͕e nile ebighi-ebi. Amen.


Ma Eze nke mb͕e nile, Nke anāpughi imebi emebi, Nke anāpughi ihu anya, Onye nání Ya bu Chineke, nsọpuru na otuto diri Ya rue mb͕e nile ebighi-ebi. Amen.


Onye-nwe-ayi gādọputam n'ajọ ọlu nile ọ bula, Ọ gāzọputakwam ka m'bata n'ala-eze-Ya di n'elu-igwe: Onye otuto diri rue mb͕e nile ebighi-ebi. Amen.


Ya me ka unu zue okè n'ezi ihe nile ọ bula ime ihe Ọ nāchọ, nēme nime ayi ihe nātọ ezi utọ n'iru Ya, site n'aka Jisus Kraist; Onye otuto nile diri rue mb͕e nile ebighi-ebi. Amen.


Ọ bu Ya nwe ike nile rue mb͕e nile ebighi-ebi. Amen.


Ma nābanu uba n'amara na ọmuma nke Onye-nwe-ayi, bú Onye-nzọputa-ayi, Jisus Kraist. Ọ bu Ya ka otuto diri ma ub͕u a ma rue ubọchi nke mb͕e ebighi-ebi. Amen.


Onye nání Ya bu Chineke, buru kwa Onye-nzọputa-ayi, ka ha site n'aka Jisus Kraist, bú Onye-nwe-ayi, diri Ya, bú otuto na idi-uku na ike na ichi-isi, mb͕e oge a nile akērughi, ub͕u a kwa, we ru kwa mb͕e nile ebighi-ebi. Amen.


ọ nēwere kwa oké olu si, Tuanu egwu Chineke, nye kwa Ya otuto; n'ihi na oge hour nke ikpé-Ya abiawo: kpọ-kwa-nu isi ala nye Ya, bú Onye kère elu-igwe na ala, oké osimiri na isi-iyi nile nke miri nile.


anurum ka ha were oké olu nāsi, O kwesiri, bú Nwa-aturu ahu Nke eb͕uworo eb͕u, inata ike nile, na àkù, na amam-ihe, na ume, na nsọpuru, na otuto, na ngọzi.


si, Amen: Ngọzi nile, na otuto nile, na amam-ihe nile, na ekele nile, na nsọpuru nile, na ike nile, na ume nile, diri Chineke-ayi rue mb͕e nile ebighi-ebi. Amen.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan