N'ihi na ọb͕ub͕a-afa adighi megide Jekob, Iju-ase adighi kwa megide Israel: Na mb͕e ahu ka agēkwu okwu bayere Jekob, baye-kwa-ra Israel, si, Le ihe Chineke meworo!
O we bilie, chiri ute-ya ngwa ngwa, pua n'iru ha nile; nke mere ka ibobo nwua ha nile n'aru, ha we to Chineke, si, Ọ dighi mb͕e ọ bula ayi huru ya otú a.
ebe ha ji nnwaputa nke ije-ozi a nēnye Chineke otuto n'ihi na edoro nkwuputa-unu n'okpuru ozi ọma Kraist, ya na n'ihi afọ-ofufo nke nnwekọ unu nēme ka ha na madu nile so unu nēnwekọ;
mb͕e ọ bula Ọ gabia ka ewe nye Ya otuto nime ndi nsọ Ya, ka ibobo-Ya we nwu kwa ihe nile n'aru nime ndi kwereri ekwe (n'ihi na ekwere àmà ayi b͕ara unu) n'ubọchi ahu.