Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Filipai 4:9 - Bible Nso

9 Ihe unu matara, nke unu nata-kwara, nke unu nu-kwa-ra, nke unu hu-kwa-ra n'arum, nēmenu ihe ndia: Chineke nke udo gānọyere kwa unu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

9 Na-emenụ ihe ọbụla unu si nʼaka m mụta, maọbụ ihe unu nụrụ, ma ọ bụkwanụ ihe unu hụrụ m ka m na-eme. Chineke onye na-enye udo ga-anọnyekwara unu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Filipai 4:9
36 Iomraidhean Croise  

atula egwu, gi ka M'nọyere: elela anya buruburu n'ujọ, n'ihi na Mu onwem bu Chineke-gi: M'gāb͕a gi ume; e, M'gēyere gi aka; e, M'gēji aka-nri nke ezi omumem kwagide gi.


Duritanu onwe-unu ọdu, ma agēmebi ya; kwuenu okwu, ma ọ gaghi-eguzosi ike: n'ihi na Chineke nọyere ayi.


Le, nwa-ab͕ọghọ ahu nāmaghi nwoke gādi ime, ọ gāmuta kwa Nwa-nwoke, Ha gākpọ kwa aha-Ya Immanuel; nke bu, ma asugharia ya, Chineke nọyere ayi.


nēzí ha ka ha debe ihe nile, ka ha ra, bú nke M'nyere unu n'iwu: ma le, Mu onwem nọyere unu ubọchi nile, rue ọgwugwu oge a.


Ọ bughi onye ọ bula nke nāsim, Onye-nwe-ayi, Onye-nwe-ayi, gābà n'ala eze elu-igwe; kama ọ bu onye nēme ihe Nnam Nke bi n'elu-igwe nāchọ.


Ma gini mere unu nākpọm, Onye-nwe-ayi, Onye-nwe-ayi, ma unu emeghi ihe nile M'kwuru?


Ma Ọ zara, si ha, Nnem na umu-nnem bu ndia ndi nānu okwu Chineke, nēme kwa ya.


Ọ buru na unu matara ihe ndia, ngọzi nādiri unu ma asi na unu nēme ha.


Unu onwe-unu bu ndi-eyìm, ma ọ buru na unu eme ihe Mu onwem nēnye unu n'iwu.


Nne-Ya si ndi nēje ozi, Ihe ọ bula Ọ si unu me, menu ya.


ma bilie, ba nime obodo, agāgwa gi ihe i nāghaghi ime.


Ma ka Chineke nke udo nọyere unu nile. Amen.


Ma Chineke nke udo gāzọpia Setan n'okpuru ukwu-unu ọsọsọ. Amara nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist diyere unu.


Ya mere ma unu nēri ihe, ma unu nāṅu ihe, ma unu nēme ihe ọ bula, nēmenu ihe nile ka ewe nye Chineke otuto.


n'ihi na Chineke abughi Chineke nke aghara, kama Ọ bu Chineke nke udo; otú ọ di nime nzukọ nile nke ndi nsọ.


Ya mere ariọm unu, burunu ndi nēṅomim.


Nke fọduru, umu-nnam, nāṅurinu ọṅu. Ka anēme unu ka unu zu okè; ka anākasi unu obi; nātukwasinu uche-unu nile n'otù ihe; nādinu n'udo: Chineke nke ihu-n'anya na udo gānọye-kwa-ra unu.


Moses we kpọ Israel nile òkù, si ha, Israel, nurunu ukpuru ndia na ikpé ndia nke mu onwem nēkwu na nti-unu ta, ka unu we muta ha, lezi kwa anya ime ha.


Umu-nnam, dinu n'otù n'iṅomim, nēle-kwa-nu ndi nējeghari otú a, otú unu nwere ayi dika ihe-atù


Udo nke Chineke, nke kachasi uche nile, gēche kwa obi-unu na èchìchè-uche-unu nche nime Kraist Jisus.


Unu onwe-unu ghọchikwara ndi nēṅomi ayi na Onye-nwe-ayi, ebe unu were ọṅù nke Mọ Nsọ nara okwu ahu nke-ọma nime ọtutu nkpab͕u;


N'ihi na unu onwe-unu, umu-nna-ayi, ghọrọ ndi nēṅomi nzukọ nile nke Chineke nke di na Judia nime Kraist Jisus: n'ihi na unu onwe-unu hu-kwa-ra otù ahuhu ahu n'aka ndi unu na ha bu otù ala, ọbuná dika ndi ahu huru ahuhu n'aka ndi-Ju;


Chineke nke udo, Ya Onwe-ya dozu kwa unu nsọ n'uzọ dum; ka edebezu kwa mọ-unu na nkpuru-obi-unu na aru-unu dum, nādighi ita uta n'ọbibia nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist.


Ma ayi atukwasiwo obi n'aru unu nime Onye-nwe-ayi, na unu nēme, gēme kwa, ihe nile ayi nēme n'iwu.


Ka Onye-nwe-ayi nọyere mọ nke gi. Ka amara dinyere unu.


Ma ghọnu ndi nēme okwu ahu, unu abu-kwa-la ndi nānu nání, ndi nārafu onwe-unu.


N'ihi nka, umu-nnam, nānunu ọku n'obi kari ime ka ọkpukpọ-unu na nrọputa-unu buru ihe nēguzosi ike: n'ihi na asi na unu e#me ihe ndia, unu agaghi-asu ngọngọ mb͕e ọ bula ma-oli:


ihe ọ bula ayi nāriọ kwa, ayi nānata ya n'aka-Ya, n'ihi na ayi nēdebe ihe nile Ọ nyere n'iwu, ayi nēme kwa ihe nile nātọ utọ n'iru Ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan