Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Filipai 4:18 - Bible Nso

18 Ma enwezuwom ihe nile, anamababiga kwa ókè: emewo ka m'zue ezù, ebe m'natara n'aka Epafrọdaitọs ihe nile si n'aka-unu bia, isisì nke ihe ísì utọ, àjà nke anānara nke-ọma, nke nātọ Chineke ezi utọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

18 Ugbu a, enweela m ihe niile na-akpa m mkpa, nʼezie, enweela m karịa ihe na-akpa m. Onyinye unu nyere m, nke Epafroditọs wetara, egboola mkpa m niile. Onyinye ndị a dị ka aja na-esi isi ụtọ a chụụrụ Chineke, nke ọ na-anabatakwa nke ọma.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Filipai 4:18
15 Iomraidhean Croise  

I gēsure kwa ebulu ahu nile ọku ibu ihe nēsì ísì utọ n'elu ebe-ichu-àjà: àjà-nsure-ọku anēsurere Jehova ka ọ bu: ihe ísì utọ, àjà-ọku anāchuru Jehova, ka ọ bu.


mb͕e unu gēme kwa àjà-ọku ichuru Jehova, bú àjà-nsure-ọku, ma-ọbu àjà ọzọ, imezu nkwa, ma-ọbu n'onyinye-afọ-ofufo, ma-ọbu na mb͕e nile unu akara àkà, ime ihe ísì utọ isurere Jehova, sitere n'ìgwè ehi, ma-ọbu n'ìgwè ewu na aturu:


na otù ngaji ọla-edo nke di shekel iri n'ọtùtù, juputara n'ihe-nsure-ọku nēsi ísì utọ;


O we legide ya anya, tu kwa egwu, si, Ọ̀ bu gini, Onye-nwe-ayi? Ọ si ya, Ekpere-gi nile na ọlu ebere gi nile rigoro ibu ihe-ncheta n'iru Chineke.


Ya mere, umu-nnam, ejim obi-ebere nile nke Chineke nāriọ unu, ka unu che aru-unu n'iru Chineke, dika àjà di ndu, di nsọ, nke di Chineke ezi utọ, nke bu ikpe-ekpere-unu dika uche si di.


Anapurum ihe n'aka nzukọ Kraist ọzọ, nānara ha ego-ọlu ka m'we jere unu ozi;


N'ihi na ije-ozi nke ifè-òfùfè a abughi nání ihe nēmezu ihe fọduru ndi nsọ inwe, kama o site-kwa-ra n'ọtutu ekele anēkele Chineke we babiga ókè;


nējeghari-kwa-nu n'ihu-n'anya, dika Kraist-ayi hu-kwa-ra unu n'anya, rara kwa Onwe-ya nye n'ihi ayi, dika ihe echere n'iru Chineke na àjà achuru nye Ya ka ọ buru isisì nke ihe ísì utọ.


Amataram uzọ iweda onwem, amata-kwa-ram uzọ ibabiga ókè: n'ihe ọ bula na n'ihe nile ezíwo mu ihe-omimi a, bú inọ n'afọ-ojuju na inọ kwa n'agu, ibabiga ókè na inọ kwa na nkpà.


Ayi ji ugwọ ikele Chineke ekele mb͕e nile bayere unu, umu-nna-ayi, dika o kwesiri, n'ihi na okwukwe-unu nāba uba nke-uku, ihunanya ahu unu nile n'otù n'otù nāhurita ibe-unu nēri kwa nne;


Ma unu echezọla ime ihe di nma na ime ka unu na ndi ọzọ nwekọ ihe-unu: n'ihi na àjà di otú a nātọ Chineke ezi utọ.


ewe were kwa unu onwe-unu, dika nkume di ndu, wu, ka unu buru ulo nke Mọ Nsọ, ka unu we buru òtù ndi-nchu-àjà di nsọ, ichu àjà nke di ka Mọ Nsọ si cho, nke di Chineke ezi nma site na Jisus Kraist.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan