Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Filipai 4:1 - Bible Nso

1 Ya mere, umu-nnam m'huru n'anya ndi agu unu nāgusikwam ike, ọṅùm na okpu-ezem, guzosienu ike otú a nime Onye-nwe-ayi, ndi m'huru n'anya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

1 Ya mere, ụmụnna m, ndị m hụrụ nʼanya, na ndị ihe ha na-agụsị m agụụ ike, unu ndị na-enye m ọṅụ, na ndị bụ okpueze m nʼihi ọrụ m na-arụ, bikonu, guzosienụ ike nʼime Onyenwe anyị.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Filipai 4:1
35 Iomraidhean Croise  

N'ezie n'ubum ka m'gēburu ya; M'gēke kwa ya n'isim dika okpu-eze.


Ndi nātukwasi Jehova obi Dika ugwu Zaion, nke anādighi-ewezuga ya n'ọnọdu-ya, kama rue mb͕e ebighi-ebi ka ọ nādigide.


Nēle anya Jehova: Di ike, ka obi-gi nwe kwa ume; E, nēle anya Jehova.


Madu nile gākpọ kwa unu asì n'ihi aham: ma onye were ntachi-obi nọgide rue ọgwugwu ihe nile, onye ahu ka agāzọputa.


Ya mere Jisus nāsi ndi-Ju ndi kwere-Ya-ri, Ọ buru na unu onwe-unu anọgide n'okwum, unu bu ndi nēso uzọm n'ezie;


onye, mb͕e ọ biaruru, mb͕e ọ hu-kwa-ra amara Chineke, ọ ṅuria; o we riọ ha nile, ka ha zube n'obi-ha inọgide n'ebe Onye-nwe-ayi nọ:


nēme ka nkpuru-obi ndi nēso uzọ Jisus guzosie ike, nāriọ ha ka ha nọgide n'okwukwe-ayi, nēgosi kwa na ayi aghaghi isite n'ọtutu nkpab͕u ba n'ala-eze Chineke.


Ha we nānọgidesi ike n'ozizí ndi-ozi na nnwekọ, n'inyawa-achicha-ha na ekpere-ha.


ndi site na ntachi-obi n'ezi ọlu nāchọ otuto na nsọpuru na apughi-imebi ka Ọ gēnye ndu ebighi-ebi:


Ya mere, umu-nnam m'huru n'anya, guzosienu ike, burunu ndi anāpughi iropu eropu, ndi nālubiga ọlu Onye-nwe-ayi ókè mb͕e nile, ebe unu matara na ndọb͕u unu nādọb͕u onwe-unu n'ọlu abughi ihe-efu nime Onye-nwe-ayi.


Nēchenu nche, nēguzosinu ike n'okwukwe-unu, burunu ndikom, nādinu ike.


dika unu mazu-kwa-ra ayi n'otù akuku, na ayi bu ihe-inya-isi-unu, ọbuná dika unu onwe-unu bu kwa ihe-inya-isi nke ayi, n'ubọchi Onye-nwe-ayi Jisus.


Kraist mere ka ayi pua n'orù ka ayi we nwere onwe-ayi: ya mere nēguzosinu ike, unu ekwela ka ewere yoke nke bu ibu-orù jide unu ọzọ.


Nání nēbinu obi dika ndi ala elu-igwe n'uzọ kwesiri ozi ọma nke Kraist: ka ọ gābu, ma m'bia hu unu ma-ọbu na anọghm, ka m'we nu ihe bayere ọnọdu-unu, na unu nēguzosi ike n'otù Mọ Nsọ, nēwere kwa otù nkpuru-obi lukọrọ okwukwe nke ozi ọma ahu ọ̀gù si-ike;


N'ihi na Chineke bu onye-àmà nkem, otú agu unu nile nāgusim ike n'obi-ebere nke Kraist Jisus.


nēche okwu nke ndu n'iru madu; ka m'we nwe ihe inya isi nye n'ubọchi nke Kraist, na ab͕aghi m ọsọ n'efu, na adọb͕ughkwam onwem n'ọlu n'efu


ebe agu unu nile nāgusi ya ike, obi lọ-kwa-ra ya miri, n'ihi na unu nuru na aru-ya adighi ike:


Epafras, onye bu otù onye n'etiti unu, orù nke Kraist Jisus, nēkele unu, nāb͕asi nb͕a ike n'ihi unu n'ekpere-ya nile mb͕e nile, ka unu we guzo dika ndi zuru okè ndi kwezuwo-kwa-ra ihe nile Chineke nāchọ.


ka O we me ka obi-unu guzosie ike nādighi ita uta n'idi-nsọ n'iru Chineke-ayi, bú Nna-ayi, n'ọbibia nke Onye-nwe-ayi Jisus, Ya na ndi nsọ Ya nile.


Ya mere otú a, umu-nna-ayi, nēguzosinu ike, jidekwanu ozizí nile enyere n'aka idebe nke ezíri unu, ma-ọbu site n'okwu-ọnu-ayi, ma-ọbu site n'akwukwọ-ozi-ayi.


Ya mere, gi onwe-gi, nwam, ka eme ka i di ike n'amara nke di nime Kraist Jisus.


ka ayi jidesie nkwuputa nke olile-anya-ayi ike ka ọ ghara iruda n'ala; n'ihi na Onye ahu Nke kwere nkwa kwesiri ntukwasi-obi:


n'ihi na ayi aghọwo ndi nketa nke Kraist, ma ọ buru na ọ bu ezie na ayi jidesiri nmalite nke ndabere-ayi ike rue ọgwugwu ihe nile:


Ya mere ebe ayi nwere Onye-isi-nchu-àjà di uku, Onye gabigaworo eluigwe nile, bú Jisus Ọkpara Chineke, ka ayi jidesie nkwuputa-ayi ike.


Ya mere, unu onwe-unu, ndi m'huru n'anya, ebe unu buru uzọ mara ihe ndia, nēchenu onwe-unu nche, ka aghara iwere njehie nke ndi nēmebi iwu bupu unu, unu we si na nguzosi-ike nke aka unu dapu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan