Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Filipai 2:29 - Bible Nso

29 Ya mere werenu ọṅù nile nara ya nke-ọma nime Onye-nwe-ayi; nāsọpuru-kwa-nu ndi di otú a:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

29 Ya mere, arịọ m unu, werenụ ọṅụ nabata ya nke ọma nʼime Onyenwe anyị, na-asọpụkwaranụ ndị dị ka ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Filipai 2:29
21 Iomraidhean Croise  

Le, ka ha si ma nma nke-uku n'elu ugwu, bú ukwu nke onye nēzisa ozi ọma, bú onye nēme ka anuru okwu udo, onye nēzisa ozi ọma nke ezi ihe, onye nēme ka anuru okwu nzọputa; onye nāsi Zaion, Chineke-gi bu eze!


Ka ha ra kwa, bú ndi nānaraghi unu nke-ọma, mb͕e unu nāpu n'obodo ahu tichapu ájá di n'ukwu-unu ka ọ buru ha àmà.


N'ezie, n'ezie, asim unu, Onye nānara onye ọ bula M'gēzite, Mu ka ọ nānara; onye nānaram nānara kwa Onye ziterem.


Ha ji kwa otù obi nānọgidesi ike n'ulo uku Chineke kwa-ubọchi, ha nānyawa kwa achicha n'ulo-ha, we nara ihe-oriri-ha n'obi utọ na obi nke aghughọ nādighi ya,


ha we were kwa ọtutu nsọpuru sọpuru ayi; mb͕e ayi nupuru ub͕ọ, ha we tiye n'ub͕ọ ihe nile di ayi nkpà.


Oké ọṅù we di n'obodo ahu.


ma hà gēsi aṅa kwusa, ma ọ buru na ezigaghi ha? dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ, si, Le, ka ha si ma nma nke-uku, bú ukwu ndi nēzisa ozi ọma nke ezi ihe!


ka unu we nara ya nke-ọma nime Onye-nwe-ayi, dika o kwesiri ndi nsọ, ka unu nēguzo kwa ya nso iyere ya aka n'okwu ọ bula nkpà unu gākpa ya: n'ihi na ya onwe-ya aburuwo kwa onye nēguzoro ọtutu madu izọ ha, mu onwem kwa.


Ma asi na Timọti abia, lezienu anya ka ọ nọgide na nke unu nātughi egwu; n'ihi na ọ nālu ọlu Onye-nwe-ayi, dika mu onwem nālu kwa:


N'ihi na ha mere ka mọ nkem na nke unu zuru ike: ya mere mazunu madu di otú a.


N'ihi na onye ya onwe-ya nēme ka amara ya, ọ bughi onye ahu ka anwaputaworo, kama ọ bu onye Onye-nwe-ayi nēme ka amara ya.


Nyenu ayi uzọ n'obi-unu; ayi emeghi onye ọ bula ajọ omume, ayi emebighi onye ọ bula, ayi erib͕ughi onye ọ bula.


Ya mere ọ nānukarim ọku n'obi iziga ya, ka ọ gābu, mb͕e unu huru ya ọzọ, ka unu we ṅuria ọṅu, ka mu onwem we nwe kwa ihe-nwuta nke dikariri ntà.


Aristakọs onye adọkọrọ mu na ya n'agha nēkele unu, ya na Mak nwa-nne Banabas (onye unu natara ihe ufọdu enyere n'iwu bayere ya; asi na ọ biakute unu, naranu ya nke-ọma),


Ma ayi nēkpere unu, umu-nna-ayi, ka unu mata ndi nādọb͕u onwe-ha n'ọlu n'etiti unu, ndi bu kwa ndi-isi-unu nime Onye-nwe-ayi, ndi nādu kwa unu ọdú;


Ka agua ndi-okenye na ndi kwesiri nsọpuru okpukpu abua, bú ndi nāchi isi nke-ọma, ma nke kachasinu ndi nādọb͕u onwe-ha n'ọlu nime okwu Chineke na ozizí.


Nēkweyenu ndi-isi-unu, nēdo-kwa-nu onwe-unu n'okpuru ha: n'ihi na ndi ahu nāmu anya n'ihi nkpuru-obi-unu, dika ndi gāza ajuju bayere unu: ka ha we were ọṅù me nka, ghara isu udè: n'ihi na nka gābu ihe nābaghi unu urù.


N'ihi nka, ọ buru na abiam, m'gēme ka echeta ọlu-ya nile nke ọ nālu, n'iwere ajọ okwu nēkwugide ayi ihe-nzuzu: afọ ejughi kwa ya n'ihe ahu, ma ya onwe-ya adighi-anara umu-nna-ayi nke-ọma, ọ nēb͕ochi kwa ndi nēzube inara ha, ọ nāchupu kwa ha na nzukọ Kraist.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan