Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Filipai 2:22 - Bible Nso

22 Ma unu mara ọnwunwa-ya, na, dika nwa nēso nna-ya, otú a ka o sorom buru orù n'izisa ozi ọma.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

22 Ma unu niile maara otu Timoti si dị oke mkpa. Ọ dị nnọọ dị ka nwa m, site nʼinyeaka ọ na-enyere m nʼọrụ izisa oziọma.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Filipai 2:22
20 Iomraidhean Croise  

Umu-nna nime Kraist ndi bi na Listra na Aikọniọm b͕ara onye ahu ezi àmà.


ntachi-obi ahu nāluta kwa ọnwunwa; ọnwunwa ahu nāluta kwa olile-anya:


Ma asi na Timọti abia, lezienu anya ka ọ nọgide na nke unu nātughi egwu; n'ihi na ọ nālu ọlu Onye-nwe-ayi, dika mu onwem nālu kwa:


N'ihi nka ka m'zitere unu Timọti, onye bu nwam nime Onye-nwe-ayi, buru kwa onye m'huru n'anya, onye kwesiri ntukwasi-obi, ọ gēchetara unu uzọm nile nke di nime Kraist, dika m'nēzí n'ebe nile na nzukọ Kraist nile ọ bula.


N'ihi na ihe mere m'degara unu akwukwọ bu kwa nka, ka m'we mara nnwaputa unu, ma unu bu ndi nāṅa nti rue ihe nile.


Ayi ezìkọwo kwa ha na nwa-nna-ayi, onye ayi nwaputara ọtutu mb͕e na ọ nānu ọku n'obi n'ọtutu ihe, ma ub͕u a ọ nānu kari ọku n'obi nke-uku, site n'oké ntukwasi-obi nke ọ nātukwasi n'aru unu.


Ya mere nēgosinu ha n'iru nzukọ Kraist nile ihe gēgosi ihu-n'anya-unu na inya-isi-ayi bayere unu.


Ekwughm n'uzọ inye iwu, kama n'iwere inu-ọku-n'obi nke ndi ọzọ nwaputa kwa ihu-n'anya-unu na ọ bu ezi ihu-n'anya.


Ma anamezube ka unu mara, umu-nnam, na, kama ihe ọzọ, ọnọdum emewo ka ozi ọma ga n'iru;


ndia nēme ya site n'ihunanya, ebe ha matara na edorom ka m'we gọpu ozi ọma:


n'ihi nnwekọ unu nwekọrọ n'izisa ozi ọma site n'ubọchi mbu rue ub͕u a;


dika o ziri ezi ka m'tukwasi uchem n'ihe a bayere unu nile, n'ihi na enwerem unu n'obim, ebe unu nile bu ndi nēsom n'inwekọ amara, ma nime ab͕um ma nime ngọpu nke ozi ọma na ime ka o guzosie ike.


N'ihi na enweghi m onye ọ bula nke nkpuru-obi-ya yiri nke ya, bú onye gēcheb͕u onwe-ya bayere ọnọdu-unu n'ezie.


Iwu a ka m'nēnye n'aka-gi idebe, nwam Timọti, dika amuma nile si di nke eburu uzọ bu bayere gi, ka i we were ha bu agha ọma nka;


anamedegara Timọti akwukwọ, bú ezi nwam n'okwukwe: Amara na ebere na udo diri gi nke si n'aka Chineke, bú Nna-ayi, na Kraist Jisus Onye-nwe-ayi puta.


Ọ buru na i me ka umu-nna-ayi nēchè uche n'ihe ndia, i gābu onye nējere Kraist Jisus ozi nke-ọma, ebe anāzùputa gi n'okwu nile nke okwukwe-ayi, na nke ozizí ọma ahu nke i soworo n'ukwu n'ukwu:


nēdegara Timọti akwukwọ, bú nwam nke m'huru n'anya: Amara na ebere na udo diri gi, nke si n'aka Chineke, bú Nna-ayi, na Kraist Jisus Onye-nwe-ayi puta.


Ma gi onwe-gi soro ozizím, omumem, ihe m'zubere, okwukwem, ogologo-ntachi-obim, ihu-n'anyam, ntachi-obim,


Pọl nka nēdegara Taitọs akwukwọ, bú ezi nwa nkem dika okwukwe ayi kwekọrọ si di: Amara na udo diri gi nke si n'aka Chineke, bú Nna-ayi, na Kraist Jisus Onye-nzọputa-ayi puta.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan