18 n'otù uzọ ahu unu onwe-unu, ṅuri-kwa-nu ọṅu, sokwam nāṅuri ọṅu.
18 otu aka ahụ, unu onwe unu kwesiri inwe obi ụtọ ma sorokwa m ṅụrịa ọṅụ.
N'ihi nka ariọm aririọ ka ike ghara igwu unu n'obi nime nkpab͕um nile n'ihi unu, nke bu otuto-unu.
E, ọ buru kwa na anāwusim dika àjà-ihe-ọṅuṅu n'elu àjà na ifè-òfùfè nke okwukwe-unu, anamaṅuri ọṅu, so kwa unu nile nāṅuri ọṅu:
Ma anamele anya nime Onye-nwe-ayi Jisus na m'gēzigara unu Timọti ọsọsọ, ka mu onwem we nwe kwa obi-utọ, mb͕e m'mara ọnọdu-unu.
Nke fọduru, umu-nnam, nāṅurinu ọṅu nime Onye-nwe-ayi. Idegara unu otù ihe ndia n'akwukwọ, n'ezie ọ bughi ihe-nsob͕u n'ebe m'nọ, ma n'ebe unu nọ ọ bu ihe-ntukwasi-obi.
Nāṅurinu ọṅu n'Onye-nwe-ayi mb͕e nile: m'gāsi ọzọ, Nāṅurinu ọṅu.