Ma mb͕e nkewa na ajuju nādighi ntà diri Pọl na Banabas imegide ha, ndi Kraist we dozie ka Pọl na Banabas, na ufọdu ndi ọzọ n'etiti ha, rigoro Jerusalem jekuru ndi-ozi na ndi-okenye bayere ajuju a.
Mb͕e ha juritarari onwe-ha ọtutu ajuju, Pita we bilie, si ha, Umu-nnam, unu onwe-unu mara na site n'ubọchi mbu Chineke rọputara n'etiti unu, ka ndi mba ọzọ we site n'ọnum nu okwu nke ozi ọma ahu, kwere kwa.
Ma anamariọ unu, umu-nnam, ka unu le ha anya, bú ndi nēweta nkewa di iche iche ahu na ọnyà di iche iche ahu, nēmegide ozizí nke unu onwe-unu mutara: ka unu nēze kwa ha.
N'ihi na anamatu egwu, ma o nwere uzọ ọ bula, mb͕e m'gābia, m'gāhu unu ka unu nābughi aha madu ahu m'nāchọ, unu ahú kwa mu onwem ka m'nābu aha madu unu ṅachọghi; ma o nwere uzọ ọ bula esem-okwu, ekworo, ọnuma, ikpa-iche-iche, nkwutọ, ntakwu, nfuli-elu, aghara, gādi;