Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Filipai 1:5 - Bible Nso

5 n'ihi nnwekọ unu nwekọrọ n'izisa ozi ọma site n'ubọchi mbu rue ub͕u a;

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

5 Nʼihi inyeaka niile unu na-enye, ime ka izisa oziọma na-aga nʼihu ọ bụladị ruo ugbu a.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Filipai 1:5
23 Iomraidhean Croise  

Ha we nānọgidesi ike n'ozizí ndi-ozi na nnwekọ, n'inyawa-achicha-ha na ekpere-ha.


Ma ọ buru na anyakapuru alaka ufọdu, ma gi onwe-gi, ọ bu ezie na i bu osisi olive nke ọhia, ma anyakudoro gi n'etiti ha, i ghọ-kwa-ra onye gi na ha nēnwekọ nkpọrọgwu nke umi nke olive ahu;


n'akuku ihe nākpà ndi nsọ, nēnwekọnu ihe; nāb͕asonu ọlu ile ndi-ọbìa anya nke-ọma.


N'ihi na ọ di Masedọnia na Akaia ezi nma inye ndi-ob͕eye n'etiti ndi nsọ nọ na Jerusalem ihe ufọdu ha gēnwekọ.


Chineke kwesiri ntukwasi-obi, Onye esitere n'aka Ya kpọbata unu na nnwekọ nke Ọkpara-Ya Jisus Kraist Onye-nwe-ayi.


Ọzọ, umu-nnam, ayi nēme ka unu mara amara Chineke nke enyeworo nime nzukọ Kraist nile nke Masedọnia;


bú, na ndi mba ọzọ bu ndi soro ayi ketakọ ihe, na idikọ n'otù aru, na ikèkọ nkwa ahu nime Kraist Jisus site n'ozi ọma,


Ma anamezube ka unu mara, umu-nnam, na, kama ihe ọzọ, ọnọdum emewo ka ozi ọma ga n'iru;


ndia nēme ya site n'ihunanya, ebe ha matara na edorom ka m'we gọpu ozi ọma:


Nání nēbinu obi dika ndi ala elu-igwe n'uzọ kwesiri ozi ọma nke Kraist: ka ọ gābu, ma m'bia hu unu ma-ọbu na anọghm, ka m'we nu ihe bayere ọnọdu-unu, na unu nēguzosi ike n'otù Mọ Nsọ, nēwere kwa otù nkpuru-obi lukọrọ okwukwe nke ozi ọma ahu ọ̀gù si-ike;


dika o ziri ezi ka m'tukwasi uchem n'ihe a bayere unu nile, n'ihi na enwerem unu n'obim, ebe unu nile bu ndi nēsom n'inwekọ amara, ma nime ab͕um ma nime ngọpu nke ozi ọma na ime ka o guzosie ike.


Ya mere, ndi m'huru n'anya, dika unu ṅara nti mb͕e nile, ọ bughi nání mb͕e m'nọ n'etiti unu, kama ub͕u a mb͕e m'nānọghi, werenu egwu na ima-jijiji luputa kari nzọputa nke onwe-unu nke-uku;


Ma unu mara ọnwunwa-ya, na, dika nwa nēso nna-ya, otú a ka o sorom buru orù n'izisa ozi ọma.


E, ariọkwam gi, onye ekekọtaworo mu na gi n'ezie n'ọlu Chineke, yere ndinyom ahu aka, n'ihi na mu na ha b͕akọsiri nb͕a ike n'ozi oma, gi na Klement, na ndi fọduru mu na ha nālukọ ọlu, ndi aha-ha di n'akwukwọ nke ndu.


Ya mere ọ buru na i gurum n'onye-nnwekọ, nara ya nke-ọma dika mu onwem.


n'ihi na ayi aghọwo ndi nketa nke Kraist, ma ọ buru na ọ bu ezie na ayi jidesiri nmalite nke ndabere-ayi ike rue ọgwugwu ihe nile:


Saimon Pita, orù na onye-ozi nke Jisus Kraist, nēdegara unu akwukwọ, bú ndi ketaworo okwukwe di oké ọnu-ahia ra ka nke ayi ketaworo n'ezi omume Onye ahu, bú Chineke-ayi na Onye-nzọputa-ayi, Jisus Kraist;


ọ bu ihe ayi huworo, nu kwa, ka ayi nākọkwara unu, ka unu onwe-unu we so kwa ayi nwekọ ya: ma nnwekọ-ayi bu kwa nke ayi soro Nna-ayi, so kwa Ọkpara-Ya Jisus Kraist, nēnwekọ:


ma ọ buru na ayi ejegharia n'ìhè ahu, dika Ya onwe-ya nọ n'ìhè ahu, ayi nēnwekọrita ihe n'etiti onwe-ayi, ọbara Jisus, bú Ọkpara-Ya, nāsachapu kwa ayi nmehie nile.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan