Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Filipai 1:26 - Bible Nso

26 ka inya-isi-unu we babiga ókè nime Kraist Jisus n'arum site n'ọbibia m'gābiakute unu ọzọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

26 Ka mgbe m ga-abịakwute unu ọzọ, unu ga-enwebiga ọṅụ oke nʼime Kraịst Jisọs nʼihi m.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Filipai 1:26
14 Iomraidhean Croise  

Abatawom n'ubim ab͕ara ogige, nwa-nnem nwayi, nwunye ọhu nkem: Aghọrọwom myrrh nkem, ya na udam; Arachawom ub͕ub͕ọ-manu-aṅum, ya na manu-aṅum; Aṅuwom manya-vine nkem, ya na miri-ara-ehim. Rienu ihe, ndi-eyim; Ṅuanu ihe-ọṅuṅu, e, ṅujuenu afọ unu ndi ihe-unu nātọm utọ.


Ya mere unu onwe-unu nēnwe kwa ihe-nwuta ub͕u a: ma M'gāhu unu ọzọ, obi-unu gāṅuri kwa ọṅu, ọ dighi kwa onye ọ bula gānara unu ọṅù-unu.


Rue ub͕u a unu akāriọghi ihe ọ bula n'aham: riọnu, unu gāriọta kwa, ka ọṅù-unu we zue oke.


dika unu mazu-kwa-ra ayi n'otù akuku, na ayi bu ihe-inya-isi-unu, ọbuná dika unu onwe-unu bu kwa ihe-inya-isi nke ayi, n'ubọchi Onye-nwe-ayi Jisus.


Ayi adighi-eme ọzọ ka unu mara ayi, kama ayi nēkwu dika ndi nēnye unu oghere inya isi n'ihi ayi, ka unu we nwe ihe iza ndi nānya isi n'ihe anāhu anya, ọ bughi kwa n'obi.


N'ihi na asi na ọ di ihe m'nyaworo ya isi bayere unu, emeghi ka ihere mem; kama dika ayi gwara unu ihe nile n'ezi-okwu, otú a ka esi hu kwa na inya-isi-ayi, nke m'nyara n'iru Taitọs, bu ezi-okwu.


Nkwuwa-okwum di uku, bú nke m'ji agwa unu okwu, inya-isim n'ihi unu di uku: nkasi-obi ezuwo ezu nimem, anamaṅuribiga ókè kari na nkpab͕u-ayi nile.


Otú ọ di, Onye ahu Nke nākasi ndi di ala obi, bú Chineke, were ọbibia Taitọs kasi ayi obi;


Ma ka onye ọ bula nwaputa ọlu nke aka ya, mb͕e ahu ka ọ gēnwe kwa ihe ọ gānyara isi n'ebe nání ya onwe-ya nọ, ọ bughi kwa n'ebe ibe-ya nọ.


Nke fọduru, umu-nnam, nāṅurinu ọṅu nime Onye-nwe-ayi. Idegara unu otù ihe ndia n'akwukwọ, n'ezie ọ bughi ihe-nsob͕u n'ebe m'nọ, ma n'ebe unu nọ ọ bu ihe-ntukwasi-obi.


n'ihi na ayi onwe-ayi bu ndi obibì-úgwù, ndi ji Mọ nke Chineke nēkpe ekpere, ndi nānya kwa isi nime Kraist Jisus, ndi natukwasighi kwa obi n'anu-aru-ayi:


Ma aṅuri rim ọṅu nke-uku nime Onye-nwe-ayi, na ub͕u a n'oge a unu malitere ọhu itukwasi uche n'ihe bayerem; nke unu nātukwasiri uche-unu nime ya n'ezie, ma unu enweghi oghere.


Nāṅurinu ọṅu n'Onye-nwe-ayi mb͕e nile: m'gāsi ọzọ, Nāṅurinu ọṅu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan