Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Filipai 1:15 - Bible Nso

15 Ọ bu ezie na ufọdu nēkwusa Kraist-ayi ọbuná n'ihi ekworo na esem-okwu; ma ufọdu nēkwusa kwa Ya n'ihi na ọ di ha ezi nma:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

15 Ọ bụ eziokwu na ụfọdụ ji ekworo na anya ụfụ na-ekwusa Kraịst, ma ụfọdụ kwa na-ezisa ya site nʼọchịchọ obi ziri ezi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Filipai 1:15
22 Iomraidhean Croise  

Ma ọlu-ha nile ka ha nālu ka madu we kiri ha: n'ihi na ha nēme ka phylactery nile ha di obosara, me kwa ka ọnu-ọnu uwe-ha di uku,


Okwu nke O zitere umu Israel, nēzisa ozi ọma nke udo site n'ọnu Jisus Kraist (Onye ahu bu Onye-nwe madu nile)


Ma ufọdu di n'etiti ha, ndikom nke Saiprọs na Sairini, ndi, mb͕e ha biaruru Antiọk, ha gwa kwa ndi-Grik okwu ahu, nēzisa ozi ọma nke Onye-nwe-ayi Jisus.


Ma kwa-ubọchi, n'ulo uku Chineke na n'ulo nke aka ha, ha adighi-arapu izí ihe na izisa ozi ọma Jisus, na Ọ bu Kraist.


Filip we saghe ọnu-ya, zì ya ozi ọma Jisus, nāmalite site n'ihe a edeworo n'akwukwọ nsọ.


Filip we rida n'obodo Sameria, kwusara ha Kraist-ayi.


Ngwa ngwa n'ulo-nzukọ-ha nile o we nēkwusa Jisus, na Ya onwe-ya bu Ọkpara Chineke.


ma ndi di n'akuku nke ikpa-iche-iche, ndi nēkweyeghi kwa ezi-okwu, kama ha nēkweye ajọ omume, iwe na ọnuma,


ma ayi onwe-ayi nēkwusa Kraist, na akpọgidere Ya n'obe, Onye buru ndi-Ju ọnyà, buru kwa ndi mba ọzọ ihe-nzuzu;


Asi kwa na ewerem ihe nile m'nwere zùa ndi-ob͕eye, asi kwa na araram arum nye ka ewe rem ọku, ma enweghm ihu-n'anya, ọ baghm urù ọ bula.


N'ihi na Ọkpara Chineke, Jisus Kraist, Onye ekwusara n'etiti unu site n'ọnu-ayi, bú site n'ọnu nkem na nke Silvanọs na nke Timọti, emeghi Ya ka Ọ buru e na é-è, kama emewo ka e di nime Ya.


N'ihi na madu di otú a bu ndi-ozi ugha, ndi-ọlu nātu ntu, ndi nēme onwe-ha ka ha yie ndi-ozi Kraist.


N'ihi na anamatu egwu, ma o nwere uzọ ọ bula, mb͕e m'gābia, m'gāhu unu ka unu nābughi aha madu ahu m'nāchọ, unu ahú kwa mu onwem ka m'nābu aha madu unu ṅachọghi; ma o nwere uzọ ọ bula esem-okwu, ekworo, ọnuma, ikpa-iche-iche, nkwutọ, ntakwu, nfuli-elu, aghara, gādi;


N'ihi na ọ bughi ayi onwe-ayi ka ayi nēkwusa, kama ọ bu Kraist Jisus, na Ọ bu Onye-nwe-ayi, ayi nāsi kwa na ayi onwe-ayi bu ndi-orù-unu n'ihi Jisus.


ma n'ihi umu-nna ugha ndi ekubatarari na nzuzo, madu ndi b͕ebatara ka ha ledo inwe-onwe-ayi nke ayi nwere nime Kraist Jisus, ka ha we me ka ayi buru orù:


unu emela ihe ọ bula n'uzọ ikpa-iche-iche ma-ọbu n'uzọ ichọ otuto efu, kama n'obi di ume-ala nāguritanu ibe-unu na ndi ka unu onwe-unu nma;


Ọ bu kwa ihe anēkwuputa na ọ di uku, bú ihe-omimi nke nsọpuru-Chineke; Onye ahu Nke emere ka Ọ puta ìhè n'anu-aru, Nke aguru Ya n'onye ezi omume nime mọ, Nke emere ka ndi-mọ-ozi hu Ya anya, Nke ekwusara Ya n'etiti ndi mba ọzọ, Nke ekwere na Ya nime uwa, Nke anara Ya n'elu nime ebube.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan